Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a N’oge ochie, ndị odeakwụkwọ, bụ́ ndị depụtaghachiri Baịbụl, gbanwere ihe n’amaokwu a ma dee ya “mkpụrụ obi m,” ka à ga-asị na Jeremaya na-ekwu maka onwe ya. Ọ ga-abụ na ha chere na ịkpọ Chineke mkpụrụ obi bụ ịkparị ya akparị ebe ọ bụ na ọ bụ ụmụ mmadụ na anụmanụ ka Baịbụl na-akpọ mkpụrụ obi. Ma n’ọtụtụ ebe na Baịbụl, e ji okwu ndị ga-enyere ụmụ mmadụ aka ịghọta onye Chineke bụ kọwaa Chineke. Ebe ọ bụ na okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” pụtakwara “ndụ” anyị, “mkpụrụ obi gị” pụtara “gịnwa.”