Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Okwu ahụ dị na Daniel 2:44, nke bụ́ ‘mee ka alaeze ndị a niile ghara ịdịkwa,’ na-ekwu banyere mba ndị chịrị ụwa, bụ́ ndị ihe oyiyi ahụ nọchiri anya ha. Ma, amụma ọzọ dị na Baịbụl nke ya na nke a na-ekwu otu ihe gosiri na “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi” ga-agbakọta ịlụso Jehova ọgụ ‘n’oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.’ (Mkpu. 16:14; 19:19-21) N’ihi ya, ọ bụghị naanị alaeze ndị nke ihe oyiyi ahụ nọchiri anya ha ka a ga-ebibi n’Amagedọn, a ga-ebibikwa alaeze niile nke ụwa.