Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Dị ka Neomi kwuru, Jehova na-enwe obiọma ma n’ebe ndị dị ndụ nọ ma n’ebe ndị nwụrụ anwụ nọ. Di Neomi na ụmụ ya abụọ anwụọla. Di Rut anwụọkwala. O doro anya na Rut na Neomi hụrụ ndị ikom atọ ahụ nwụrụ anwụ n’anya nke ukwuu. N’ihi ya, e nwere ike ikwu na ihe ọma ọ bụla mmadụ meere Neomi na Rut, onye ahụ meere ya ndị ikom atọ ahụ nwụrụ anwụ n’ihi na ha ga-achọ ka a na-elekọta Neomi na Rut.