Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
d Boaz bunyere Rut ọka bali dị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ sia isii. O nwere ike ịbụ na ihe mere o ji dịrị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ isii bụ iji gosi na ebe ọ bụ na a na-arụ ọrụ ụbọchị isii ma zuo ike n’ụbọchị nke asaa, oge Rut dọgburu onwe ya n’ọrụ agwụwala, nakwa na oge ọ ‘ga-ezu ike’ n’ụlọ di ya eruwela. O nwekwara ike ịbụ na ọ bụ naanị ọka dị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ isii, ya bụ, ihe dị ka shọvel isii, ka Rut nwere ike ibuli.