Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Ọ bụ Lemek gụrụ Noa aha ya ahụ. Ọ ga-abụ na aha ahụ pụtara “Ezumike” ma ọ bụ “Nkasị Obi.” Lemek bukwara amụma na Noa ga-emezu ihe aha ya pụtara nke bụ́ na ọ ga-arụ ọrụ ga-eme ka ụmụ mmadụ zuru ike ná ndọgbu ha na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ihi ọnụ a bụrụ ala. (Jenesis 5:28, 29) Lemek nwụrụ tupu amụma a emezuo.