Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ihe atụ a Jizọs mere gosiri ihe ndị Juu na-eme n’oge ahụ. Ndị Juu ejighị ile ọbịa egwuri egwu. Ezinụlọ ọ bụla na-eme achịcha ha ga-ericha n’otu ụbọchị, n’ihi ya, ndị nke ha gwụrụ na-aga agbazite na nke ndị agbata obi ha. Ọ bụrụkwa na ezinụlọ enweghị ego, ha niile na-ehi n’otu ọnụ ụlọ.