Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
c Mmadụ ịghọ di ya ma ọ bụ nwunye ya aghụghọ ma gbaa ya alụkwaghịm jọgburu onwe ya n’anya Chineke. Ma, ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye akwaa iko, Chineke nyere onye nke aka ya dị ọcha ikike ikpebi ma ọ̀ ga-agba ya alụkwaghịm ka ọ̀ ga-ahapụ ịgba ya. (Malakaị 2:16; Matiu 19:9) Gụọ isiokwu bụ́, “Echiche nke Baịbụl—Ụdị Ịgba Alụkwaghịm Dị Aṅaa Ka Chineke Kpọrọ Asị?” Ọ gbara na Teta! May 8, 1994. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.