Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b E mechaa Ememme Ngabiga, echi ya na-abụ abalị iri na ise n’ọnwa Naịsan. Ọ bụ ya bụ ụbọchị mbụ nke Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko. Ọ na-abụ ụbọchị izu ike. Ma ọ dabara na n’afọ 33, abalị iri na ise n’ọnwa Naịsan bụ Satọdee, nke pụtara na ọ bụ ụbọchị izu ike. Ma, ebe ọ bụkwa ya bụ ụbọchị mbụ nke Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko, ọ pụtara na Ụbọchị Izu Ike abụọ dabara n’otu ụbọchị. Ọ bụ ya mere abalị iri na ise n’ọnwa Naịsan ji bụrụ ‘Ụbọchị Izu Ike nke ukwu.’—Gụọ Jọn 19:31, 42.