Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Otu ọkà mmụta bụ́ onye Jamanị aha ya bụ Heinrich Meyer kwuru na ndịozi Jizọs agaghị eche na ọ bụ ahụ́ Jizọs ka ha na-ata nakwa na ọ bụ ọbara ya ka ha na-aṅụ n’ihi na “o nwebeghị ihe mere ahụ́ Jizọs, (ya bụ, Jizọs ka dị ndụ).” O kwukwara na Jizọs ji “okwu dị mfe” kọwaa ihe achịcha na mmanya ahụ pụtara nakwa na Jizọs agaghị achọ ka ndịozi ya ghọtahie ihe o kwuru.