Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ụfọdụ ndị na-eme nchọpụta kwuru na ọ ga-abụ na ụmụnne Josef chere na ihe ahụ nna ha meere Josef gosiri na ọ chọrọ iji Josef mere ọkpara. Ha ma na Josef bụ nwa mbụ nwunye Jekọb kacha hụ n’anya mụrụ. Ọ bụkwa nwaanyị ahụ gaara abụ nwunye mbụ ya. Ihe ọzọ bụ na Ruben, bụ́ ọkpara Jekọb, gara dinaa iko nna ha. Ihe a o mere menyere nna ha ihere, meekwa ka a gharazie iji ya mere ọkpara.—Jenesis 35:22; 49:3, 4.