Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Ndị Ijipt oge ochie na-eri ihe karịrị ụdị achịcha iri itoolu. Nke a gosiri na onyeisi ndị na-emere Fero achịcha abụghị obere mmadụ. Onyeisi ndị na-ebu ihe ọṅụṅụ abụghịkwa obere mmadụ n’ihi na ọ bụ ya bụ onyeisi ndị na-ahụ na mmanya Fero na-aṅụ bụ ịgba nakwa na e tinyeghị ya nsí. Onye ọ bụla bụ́ onyeisi ndị obu ihe ọṅụṅụ na-abụkarịkwa onye ndụmọdụ eze a tụkwasịrị obi.