Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Abụ Debora gosiri na ụmụ nwaanyị so n’ihe nkwata Sisera na-ejikarị alọta n’agha. Mgbe ụfọdụ, ndị agha ya na-eketacha ihe karịrị otu nwaanyị n’ime ndị ọ kpọ lọta. Ihe a kpọrọ ụmụ nwaanyị ná Ndị Ikpe 5:30 bụ “akpa nwa.” Ihe a a kpọrọ ha gosiri na ndị Kenan weere na ụmụ nwaanyị ndị ahụ bara uru naanị n’ihi akụkụ ahụ́ ha e ji enwe mmekọahụ. O yikarịrị ka o nweghị ihe e ji idina nwaanyị n’ike kpọrọ na Kenan.