Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Gịnị mere ndị Izrel agwaghị ndị Kenan ihe ha ga-eme ka ha na ha mee udo tupu ha ebuso ha agha? Ọ bụ n’ihi na o meela narị afọ anọ kemgbe e nyere ndị Kenan ohere ka ha gbanwee àgwà ọjọọ ha. N’oge ahụ ndị Izrel busoro ha agha, ndị Kenan akpọọla ekwo nkụ n’ihe ọjọọ ha na-eme. (Jenesis 15:13-16) Ọ bụ ya mere e ji kwesị ibibi ha kpamkpam. Ma, e nwere ụfọdụ ndị Kenan a hapụrụ ndụ n’ihi na ha chegharịrị.—Jọshụa 6:25; 9:3-27.