Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a E nwere otu nwoke aha ya bụ Tasitọs. A mụrụ ya mgbe ndịozi Jizọs ka nọ ndụ. O kwuru, sị: “Ọ bụ mgbe Taịbiriọs na-achị ka otu n’ime ndị ọchịchị anyị aha ya bụ Pọntiọs Paịlet mara Kraịst ikpe ọnwụ, onye e si n’aha ya nweta aha bụ́ [Ndị Kraịst].” Ndị ọzọ kọrọ gbasara Jizọs bụ Switoniọs (ọ dịrị ndụ n’oge ndịozi Jizọs); Josifọs bụ́ onye Juu bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme (ọ dịrị ndụ n’oge ndịozi Jizọs); nakwa Plini nke Nta, bụ́ gọvanọ Bitinia (obere oge ndịozi Jizọs nwụchara).