Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Otu nna ji Sera na Ebreham. Aha nna ha bụ Tira. (Jenesis 20:12) Ọ bụ eziokwu na mmadụ ịlụ onye otu nna ji ya na ya taa adịghị mma, ma anyị ga-echeta na otú ihe dị ugbu a abụghị otú ihe dị n’oge ahụ. Ezughị okè akpawabeghị ike n’ahụ́ ndị dịrị ndụ n’oge ahụ otú ọ na-akpa n’ahụ́ anyị taa. Ọ bụ ya mere ọrịa ndị mmadụ na-ebute n’ihi ịlụ nwanne ha anaghị arịa ụmụ ha n’oge ahụ. Ma, mgbe ihe dị ka narị afọ anọ gachara, ndị mmadụ anaghịzi adịte ndụ aka otú ahụ ọ dịkwa taa. N’oge ahụ, Iwu Mozis kwuru na mmadụ na onye ikwu ya ekwesịghị inwe mmekọahụ́.—Levitikọs 18:6.