Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Onye Kraịst nwere ike ikpebi inwe égbè ọ ga-eji na-egbute anụ ma ọ bụ nke ọ ga-eji na-echebe onwe ya ka anụ ọhịa ghara imerụ ya ahụ́. Ma, mgbe ọ na-enweghị ihe e ji ya eme, ọ ga-akacha mma ka e wepụ mgbọ dị na ya, ma ọ bụdị tụkasịa ya ma dewe ya n’ebe a kpọchiri akpọchi. Ọ bụrụ na a machibidoro égbè iwu n’obodo ma ọ bụ na e nyere iwu ụfọdụ gbasara ya, Ndị Kraịst na-erubere iwu ahụ isi.—Rom 13:1.