a A kpọọ “ụmụnna,” ụmụnna nwaanyị sokwa na ha. Mgbe Pọl degaara ndị Rom akwụkwọ ozi, ọ bụ “ụmụnna” ka o degaara ya. O doro anya na ụmụnna nwaanyị so na ha. Ọ kpọrọ ụfọdụ n’ime ha aha. (Rom 16:3, 6, 12) Kemgbe ụwa n’Ụlọ Nche, a na-akpọ Ndị Kraịst ‘ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị.’