Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Prọfesọ C. Marvin Pate kwuru na ụfọdụ ndị ọkà mmụta kweere na mgbe Jizọs sịrị “taa,” ihe ọ na-ekwu bụ na ọ ga-anwụ ma gaa na Paradaịs n’ụbọchị ahụ, ma ọ bụ n’ime iri awa abụọ na anọ ọ nwụrụ. Prọfesọ a kwukwara na nsogbu nkọwa a nwere bụ na ọ dabaghị n’ihe ndị e kwuru n’ebe ndị ọzọ na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na Jizọs nọrọ n’ili mgbe ọ nwụrụ, nakwa na o mechara gaa n’eluigwe.—Mat. 12:40; Ọrụ 2:31; Rom 10:7.