Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Anyị niile hụrụ Jehova n’anya ma na-eto ya otú ahụ Devid mere. Anyị nwere ohere magburu onwe ya igosi na anyị hụrụ Jehova n’anya ma anyị bịa ọmụmụ ihe iji fee ya. Ma ọ na-esiri ụfọdụ n’ime anyị ike ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. Ọ bụrụ na ụdị ihe a na-eme gị, isiokwu a ga-enyere gị aka ịghọta ihe mere ụjọ ji na-atụ gị ịza ajụjụ, nyekwara gị aka ịkwụsị ịtụ ụjọ.