Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b NKỌWA FOTO: Ebe ụmụnna na-azacha Ụlọ Nzukọ Alaeze, nwanna aha ya bụ Joe akwụsịtụ, ya na nwanna ọzọ na nwa ya nwoke ana-akparịta ụka. Ihe a were Nwanna Mike ya na ya so na-arụ ọrụ iwe. Mike asị n’obi ya, ‘Joe kwesịrị ilekwasị anya n’ihe ọ na-eme, ọ bụghị ịnọ na-akparịta ụka.’ Mike mechara hụ ebe Joe nọ na-enyere nwanna nwaanyị mere agadi aka. O metụrụ ya n’ahụ́, meekwa ka o chewe gbasara àgwà ọma ndị Nwanna Joe nwere.