Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Isiokwu afọ 2020 na-agwa anyị ka anyị na-eme ka ndị mmadụ bụrụ “ndị na-eso ụzọ” Jizọs. Ndị niile na-efe Chineke kwesịrị ịna-eme ya. Olee otú anyị ga-esi kụzie ihe ga-aba n’obi ndị anyị na-amụrụ ihe ka ha nwee ike ịbụ ndị na-eso ụzọ Kraịst? N’isiokwu a, anyị ga-ahụ otú anyị ga-esi nyere ndị anyị na-amụrụ ihe aka ka ha na Jehova dịkwuo ná mma. Anyị ga-elebakwa anya n’otú anyị ga-esi kpebie ma ànyị ga-akwụsị ihe anyị na-amụrụ mmadụ, ka ànyị ga-amụrụ na-aga.