Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b NKỌWAKWU: Ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ: Jehova na-eji mmụọ nsọ ya ahọrọ mmadụ ka o soro Jizọs bụrụ eze n’eluigwe. Ọ na-eji mmụọ nsọ ya ekwe onye ahụ nkwa ihe a ga-enye ya n’ọdịnihu. Ọ bụ ya ka Baịbụl kpọrọ ‘ihe àmà e bu ụzọ nye’ ndị e tere mmanụ. (Efe. 1:13, 14) Ndị Kraịst ndị a nwere ike ikwu na mmụọ nsọ na-agbara ha àmà, ya bụ, na-eme ka o doo ha anya na ha ga-enweta ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe.—Rom 8:16.