Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
c NKỌWA FOTO: Ebe ndị okenye na-enwe nnọkọ, a gwa otu nwanna katarala ahụ́, nke na-eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche n’ọgbakọ ha, ka ọ zụọ nwanna nke ọzọ na-akatabeghị ahụ́ ka ọ rụwa ọrụ ahụ. N’agbanyeghị na ọrụ ahụ na-atọ nwanna ahụ katarala ahụ́ ụtọ, o ji obi ya niile kwado ihe ahụ ndị okenye kpebiri ma na-agwa nwanna ahụ ihe ndị ga-enyere ya aka ịrụ ọrụ ahụ, jirikwa obi ya niile na-aja ya mma.