Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b NKỌWA FOTO: Foto atọ ndị a na-egosi ihe na-eme tupu ọmụmụ ihe amalite, mgbe ọmụmụ ihe na-aga n’ihu, na mgbe a gbasara. Foto nke 1: Ebe otu okenye ji ihu ọchị na-ekele onye bịara ọmụmụ ihe, ebe otu nwanna na-eto eto na-edozi ígwè okwu, na ebe otu nwanna nwaanyị na nwanna nwaanyị merela agadi na-ekwurịta okwu. Foto nke 2: Ebe ma ndị na-eto eto ma ndị agadi na-agbalị ịza ajụjụ n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Foto nke 3: Ebe otu di na nwunye na-enye aka na-eme ka Ụlọ Nzukọ Alaeze dị ọcha. Ebe otu nwanna nwaanyị na-enyere nwa ya aka itinye ego n’igbe onyinye. Ebe otu nwanna na-eto eto na-elekọta akwụkwọ, nwanna nke ọzọ ana-agba nwanna nwaanyị merela agadi ume.