Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Nwoke lụọ nwaanyị, ọ na-abụ onyeisi ezinụlọ ọhụrụ. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ikike Jehova nyere ndị ọzọ na ihe mere o ji nye ha ya, nakwa n’ihe ụmụ nwoke nwere ike ịmụta n’ihe Jehova na Jizọs Kraịst mere. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle ihe ndị di na nwunye nwere ike ịmụta n’aka Jizọs Kraịst nakwa n’aka ndị ọzọ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. N’isiokwu nke atọ, anyị ga-eleba anya n’ihe ụmụnna nwoke ga-eji ikike e nyere ha n’ọgbakọ na-eme.