Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a N’agbanyeghị na Jizọs bụ Onye Ozizi kacha ukwuu dịtụrụla ndụ n’ụwa, ọtụtụ ndị mmadụ ekweghị ege ya ntị. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe anọ kpatara ya. Anyị ga-ahụkwa ihe mere ọtụtụ ndị taa ekweghị ege ndị na-eso ụzọ Jizọs ntị n’ihi ihe ndị ha na-eme na ihe ndị ha na-ekwu. Nke kacha nke, anyị ga-amụta ihe mere anyị kwesịrị iji nwee okwukwe siri ike n’ebe Jizọs nọ ka anyị ghara ịsụ ngọngọ.