Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ọrụ magburu onwe ya Chineke nyere anyị abụghị naanị ikwusa ozi ọma. O nyekwara anyị ọrụ ịkụziri ndị mmadụ ka ha debe ihe niile Jizọs nyere n’iwu. Gịnị mere anyị ji achọ ịkụziri ndị mmadụ ihe? Olee ihe ụfọdụ nwere ike isiri anyị ike n’ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ? Olee otú anyị nwere ike isi merie ihe isi ike ndị ahụ? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a.