Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Mmadụ niile nwere otu nsogbu ma ọ bụ ọzọ. Ma, o nweghị ihe anyị ga-emeli gbasara ọtụtụ n’ime ha ugbu a. Ihe anyị ga-eme bụ ịna-atachi obi. Ma, ọ bụghị naanị anyị na-atachi obi. Jehova n’onwe ya na-atachikwa obi n’ọtụtụ ihe. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’itoolu n’ime ha. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe ntachi obi Jehova rụpụtara nakwa otú ọ ga-esi abara anyị uru.