Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ka ihe nwee ike ịna-aga nke ọma n’ezinụlọ, onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ kwesịrị ịma ọrụ ya, na-enyekwara ibe ya aka. Nna kwesịrị iji ịhụnanya na-edu ezinụlọ ya, nwunye ya ana-enyere ya aka, ụmụ ha ana-erubekwara ha isi. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ezinụlọ Jehova. O nwere ihe ndị Jehova chọrọ ka anyị na-eme. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị ahụ, anyị ga-abụ ndị ezinụlọ ya ruo mgbe ebighị ebi.