Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ị̀ nụtụla ka onye fere Jehova ruo ọtụtụ afọ kwuru, sị: ‘Amaghị m na ụwa ochie a ga-adịgide ruo ugbu a’? Anyị niile na-achọsi ike ịhụ mgbe Jehova ga-ebibi ụwa ọjọọ a, karịchaa, n’oge a ihe siri ezigbo ike. Ma, anyị kwesịrị ịmụta inwe ndidi. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe Baịbụl kwuru nwere ike inyere anyị aka ịna-enwe ndidi. Anyị ga-elebakwa anya n’ebe abụọ anyị kwesịrị iji ndidi chere Jehova. N’ikpeazụ, anyị ga-atụle uru ndị anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị adịrị njikere ichere.