Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Akwụkwọ Nsọ mere ka o doo anya na ọ bụ Jehova Chineke kere ihe niile. Ma, ọtụtụ ndị ekwetaghị. Ha na-ekwu na ihe niile nọkatara dịrị. Ihe ha na-ekwu agaghị eme ka okwukwe anyị gharazie isi ike ma ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike mee ka okwukwe anyị sie ike na Chineke nakwa na Baịbụl. Isiokwu a ga-akọwara anyị otú anyị ga-esi eme ka okwukwe anyị sie ike.