Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Anyị hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu, chọọkwa ime ihe niile anyị nwere ike ime n’ozi ya. Ihe a nwere ike ime ka anyị chọọ ijekwuru Jehova ozi ma ọ bụkwanụ ruo eru ịrụ ọrụ ụfọdụ n’ọgbakọ. Ọ bụrụkwanụ na anyị agbalịa ike anyị niile ma anyị emelighị ihe ụfọdụ anyị chọrọ ime? Olee otú anyị ga-esi nọgide na-arụ ọrụ Jehova ma ka na-enwe obi ụtọ? Ihe atụ Jizọs mere gbasara talent ga-enyere anyị aka ịmata azịza ya.