Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ihe onye ji obi ya niile chegharịa na-eme abụghị naanị ikwu na mmehie o mere na-ewute ya. Isiokwu a ga-eji ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl kụziere anyị ihe mmadụ iji obi ya niile chegharịa pụtara. Ndị ahụ bụ, Eze Ehab, Eze Manase, na nwa mmefu Jizọs ji mee ihe atụ. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịtụle ihe ụfọdụ ndị okenye kwesịrị ichebara echiche ma ha kpebiwe ma onye mere mmehie dị oké njọ ò chegharịala n’eziokwu.