Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Anyị hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu, chọọkwa ime ihe dị ya mma. Jehova dị nsọ. Ọ chọkwara ka ndị na-efe ya dịrị nsọ. Ma, ò kwere omume ụmụ mmadụ na-ezughị okè ịdị nsọ? Ee, o kwere omume. Iche gbasara ihe Pita onyeozi gwara ụmụnna ya na ihe Jehova gwara ụmụ Izrel oge ochie ka ha mee ga-enyere anyị aka ịmụta otú anyị ga-esi dị nsọ n’àgwà anyị niile.