Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Mgbe Jizọs kwuru na atụrụ ya ga-ege ntị n’olu ya, ihe ọ na-ekwu bụ na ndị na-eso ụzọ ya ga-ege ntị n’ihe ndị ọ na-akụzi ma na-eme ya eme ná ndụ ha. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe abụọ Jizọs kụziri. Ha bụ, ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị maka ihe ndị dị anyị mkpa nakwa ka anyị kwụsị ikpe ndị ọzọ ikpe. Anyị ga-elebakwa anya n’otú anyị ga-esi na-eme ha.