Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ma ànyị nwere olileanya ibi n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs, anyị niile na-atụ anya ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs kwa afọ. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru mere anyị ji aga Ncheta Ọnwụ Jizọs nakwa uru ịga ya na-abara anyị.