Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Jehova bụ Enyi kachanụ anyị nwere. Anyị ji enyi anyị na ya bụ kpọrọ ihe. Anyị chọkwara ịmatakwu ya nke ọma. Ịmata mmadụ na-ewe oge. Ọ ga-ewekwa anyị oge ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Jehova nọgide na-adị ná mma. Ebe ọ bụ na anyị anaghị enwekarị ohere, olee otú anyị nwere ike isi wepụta oge anyị ga-eji bịarukwuo Nna anyị nke eluigwe nso, oleekwa uru ime otú ahụ ga-abara anyị?