Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Timoti bụ aka ochie n’ikwusa ozi ọma. N’agbanyeghị ya, Pọl onyeozi gbara ya ume ka ọ na-emekwu nke ọma n’ofufe Jehova. Timoti mere ihe a Pọl gwara ya, ya emee ka ọ na-abakwuru Jehova na ụmụnna ya uru. Dị ka Timoti, ị̀ chọrọ ịna-ejekwuru Jehova na ụmụnna gị ozi? O doro anya na ị chọrọ. Olee ihe ị ga-ekpebi ime ga-enyere gị aka ime otú ahụ? Oleekwa ihe i kwesịrị ime ka i nwee ike ime ihe ndị ahụ i kpebiri ime?