Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Ndị mbụ a ga-akpọlite n’ọnwụ nwere ike ịbụ ndị ezi omume nwụrụ n’oge ikpeazụ a, ndị ga-eso ha abụrụ ndị nwụrụ tupu hanwa, e sizie otú ahụ laghachiwe azụ, si n’otu ọgbọ gaa n’ọgbọ ọzọ. O mee otú ahụ, ọgbọ nke ọ bụla ga-enwe ike ịnabata ndị ha mabu ama. Nke ọ bụla ọ bụ, ihe Baịbụl kwuru banyere ndị ga-aga eluigwe bụ na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ “n’usoro.” Obi kwesịrị isi anyị ike na a ga-akpọlitekwa ndị ga-ebi n’ụwa n’usoro.—1 Kọr. 14:33; 15:23.