Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a N’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs, a na-agba anyị ume ka anyị chee gbasara ndụ Jizọs, ọnwụ ya, na otú ya na Nna ya si gosi na ha hụrụ anyị n’anya. Ime otú ahụ nwere ike ime ka anyị mee ihe gosiri na obi dị anyị ụtọ maka ya. N’isiokwu a, anyị ga-ekwu ihe ụfọdụ anyị ga-eme iji gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ, nakwa otú Jehova na Jizọs si hụ anyị n’anya. Anyị ga-ahụkwa otú o nwere ike isi mee ka anyị hụ ụmụnna anyị n’anya, ka anyị na-enwe obi ike, nakwa ka anyị jiri ọṅụ na-ejere Jehova ozi.