Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ịgụ gbasara ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ na-atọgbu anyị atọgbu. Dị ka ihe atụ, o mere ka oké ifufe kwụsị, gwọọ ndị na-arịa ọrịa, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ. Ihe mere e ji dee ọrụ ebube ndị a ọ rụrụ abụghị iji mee anyị obi ụtọ, kama ọ bụ iji kụziere anyị ihe. Ka anyị na-eleba anya n’ọrụ ebube ndị a Jizọs rụrụ, anyị ga-amụta ihe gbasara Jehova na Jizọs ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. Anyị ga-achọpụtakwa àgwà ndị magburu onwe ha anyị kwesịrị ịmụta.