Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ọtụtụ ndị Izrel ndị hụrụ ọrụ ebube Jehova rụrụ n’Oké Osimiri Uhie abanyeghị n’Ala Nkwa ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 14:22, 23) Jehova kwuru na ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe ga-anwụ n’ala ịkpa. (Ọnụ Ọgụ. 14:29) Ma, Joshụa, Keleb, na ọtụtụ ndị na-erubeghị afọ iri abụọ, nakwa ọtụtụ ndị si n’ebo Livaị, anwụghị. Ha gafere Osimiri Jọdan banye n’ala Kenan ma hụ ka Jehova mezuru nkwa o kwere ndị Izrel.—Diut. 1:24-40.