Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
d Ihe ndị Juu oge a ji ekpebi ụbọchị ọnwa Naịsan malitere bụ mgbe ndị ọkà mmụta sayensị kwuru na e nweela ọnwa ọhụrụ. Ma, ọ bụghị otú e si amata ya n’oge Jizọs. Kama, n’oge Jizọs, otú e si ekpebi ụbọchị mbụ n’ọnwa bụ ụbọchị mbụ a hụrụ ọnwa ọhụrụ na Jeruselem. O nwere ike ịbụ otu ụbọchị ma ọ bụ karịa ma ndị ọkà mmụta sayensị kwuchaa na e nweela ọnwa ọhụrụ. Ihe a so n’ihe mere na ụbọchị Ndịàmà Jehova ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs ji adị iche mgbe ụfọdụ n’ụbọchị ndị Juu oge a ji eme Ememme Ngabiga.