Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ dịghị mma ikwu na Meri mụrụ “Ọkpara Chineke,” n’ihi na ọ na-eme ka o yie ka Chineke na nwaanyị ò nwere mmekọahụ. Ma, o nweghị ebe ụdị echiche ahụ dị n’Akwụkwọ Nsọ. Kama nke ahụ, Baịbụl kpọrọ Jizọs “Ọkpara Chineke,” kpọọkwa ya “onye e bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke” n’ihi na ọ bụ naanị ya ka Chineke kere n’onwe ya, bụrụkwa onye mbụ Chineke kere. (Ndị Kọlọsi 1:13-15) Baịbụl kpọkwara nwoke mbụ bụ́ Adam “nwa Chineke.” (Luk 3:38) Nke a bụ n’ihi na ọ bụ Chineke kere Adam.