Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Jehova bụ aha ndị Igbo na-akpọ Chineke. Ha si n’aha ndị Hibru na-akpọ Chineke nweta ya, ya bụ, mkpụrụ okwu anọ a יהוה (YHWH). A na-akpọkwa mkpụrụ okwu Hibru anọ a Tetragramatọn. N’amaokwu a, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik kpọrọ aha a “Osebụrụwa.” Ị chọọ ịmatakwu gbasara aha a bụ́ Jehova nakwa ihe mere ọtụtụ ndị sụgharịrị Baịbụl ji wepụ ya na Baịbụl ha sụgharịrị, gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Jehova?”