Obedaya
Ihe a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru banyere Ịdọm:+
“Anyị anụla ozi Jehova ziri.
E nwere onye ozi e zigara ná mba dị iche iche, ya ana-asị:
‘Bilienụ, ka anyị jikere ịlụso ya agha.’”+
2 “Lee, emeela m ka ị ghara ịbụ ihe ọ bụla n’anya mba dị iche iche.
A na-eledakwa gị anya.+
I bi n’ebe dị elu, na-asị n’obi gị,
‘Ònye ga-akwatu m n’ala?’
4 Ọ bụrụgodị na i mee ka ebe i bi dị elu ka ebe ugo na-ebi,*
Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ị kpaa akwụ́ gị n’ebe kpakpando dị,
M ga-esi n’ebe ahụ kwatuo gị.” Ọ bụ ihe Jehova kwuru.
5 “Ọ bụrụ na ndị ohi abịa na nke gị, ndị na-apụnara mmadụ ihe abịakwute gị n’abalị,
Ọ̀ bụ na ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-ezuru?
Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ndị na-aghọ mkpụrụ vaịn abịakwute gị,
Ọ̀ bụ na ha agaghị aghọfọ mkpụrụ?+
Ma, a ga-ebibi gị kpamkpam.*
6 Ewoo, a chọtala Ịsọ!
A chọtala akụ̀ ya ndị e zoro ezo ma bukọrọ ha.
7 Ha achụpụla gị ruo n’ókè nke ala ha.
Ndị niile gị na ha dị ná mma* aghọgbuola gị.
Ndị gị na ha dị n’udo emeriela gị.
Ndị gị na ha na-erikọ nri* ga-eji ụgbụ siere gị ọnyà,
Ma, ị gaghị achọpụta.”
8 Jehova kwuru, sị, “N’ụbọchị ahụ,
Ọ̀ bụ na agaghị m ebibi ndị ma ihe n’Ịdọm,+
Bibiekwa ndị nwere nghọta n’ala Ịsọ bụ́ ugwu ugwu?
9 Timan,+ ụjọ ga-ejidekwa ndị agha gị,+
N’ihi na a ga-ebibi onye ọ bụla n’ime ha nọ n’ala Ịsọ bụ́ ugwu ugwu.+
10 Ebe ọ bụ na i mesiri nwanne gị, bụ́ Jekọb, ike,+
Ihere ga-emegbu gị,+
A ga-ebibikwa gị ruo mgbe ebighị ebi.+
11 N’ụbọchị i guzo na-ele ya n’anya n’anya,
N’ụbọchị ndị ala ọzọ dọọrọ ndị agha ya n’agha,+
Mgbe ndị mba ọzọ banyere n’ọnụ ụzọ ámá ya, feekwa nza+ iji kerie Jeruselem,
I mere ka otu n’ime ha.
12 I kwesịghị ịnọ na-achị nwanne gị ọchị n’ụbọchị ọdachi dakwasịrị ya.+
I kwesịghị ịṅụrị ọṅụ n’ihi ihe mere ndị Juda n’ụbọchị a na-ebibi ha.+
I kwesịghịkwa ịnọ na-etu ọnụ n’ụbọchị ha na-ata ahụhụ.
13 I kwesịghị ịbata n’ọnụ ụzọ ámá nke ndị m n’ụbọchị ọdachi dakwasịrị ha.+
I kwesịghị ịnọ na-achị ọchị n’ihi ahụhụ ọ na-ata n’ụbọchị ọdachi dakwasịrị ya.
I kwesịghịkwa imetụ akụ̀ ya aka n’ụbọchị ọdachi dakwasịrị ya.+
14 I kwesịghị iguzo n’ebe ụzọ gbara mkpị ka i gbuo ndị ya gbapụrụ agbapụ.+
I kwesịghịkwa inyefe ndị ya gbara ọsọ ndụ n’aka ndị iro ha n’ụbọchị ahụhụ.+
15 N’ihi na ụbọchị Jehova nke ga-abịakwasị mba niile dị nso.+
Otú i si mesoo ndị ọzọ ka a ga-esi emeso gị.+
Ihe i mere ndị ọzọ ga-alọghachi n’isi gị.
Ha ga-aṅụ ya ma loda ya,
Ha ga-adịkwa ka ndị na-adịtụbeghị adị.
17 Ma, a ga-enwe ndị a ga-echebe n’Ugwu Zayọn,+
Ọ ga-adịkwa nsọ,+
Ụlọ Jekọb ga-ewegharakwa ihe bụ́ nke ha.+
18 Ụlọ Jekọb ga-aghọ ọkụ,
Ụlọ Josef aghọọ ire ọkụ.
Ụlọ Ịsọ ga-adịkwa ka ahịhịa ọka.
Ha ga-amụnye ụlọ Ịsọ ọkụ ma repịa ya.
A gaghịkwa enwe onye si n’ụlọ Ịsọ ga-afọ ndụ,+
N’ihi na Jehova ekwuola ya.
Ha ga-eweghara ala Ifrem nakwa ala Sameria,+
Benjamin ga-ewegharakwa Gilied.
20 Ndị e si ná mgbidi a siri ike+ dọrọ n’agha,
Ya bụ, ndị Izrel, ga-enwezi ala ndị Kenan ruo Zarefat.+
Ndị e si na Jeruselem dọrọ n’agha, bụ́ ndị nọ na Sefarad, ga-ebirizi n’obodo ndị dị na Negeb.+