Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Enyi Adịgboroja
    Teta!—2010 | Julaị
    • Enyi Adịgboroja

      Ka e were ya na i metere otu enyi n’oge ị na-eto eto. Enyi gị ahụ mere gị ka i were onwe gị ka dimkpa, o yikwara ka ò mere ka ndị ọgbọ gị ghara ilewe gị anya ka onye ime ọhịa. E nwee ihe na-echegbu gị, ị na-agakwuru ya ka o nyere gị aka. N’eziokwu, ọ bụ ya ka ị na-agakwurukarị ma i nwee nsogbu.

      Ma ka oge na-aga, gị achọpụta ihe ndị na-adịghị mma banyere enyi gị ahụ. Ọ na-achọkarị ka gị na ya na-anọ n’agbanyeghị na gị na ya nọrọ, ụfọdụ ndị anaghị achọ ịkpa gị nso. Ọ bụ eziokwu na o mere gị ka i were onwe gị ka dimkpa, ma ọ na-akpatara gị ọrịa. E wezụgakwa nke ahụ, ọ na-ezu ego gị.

      Na nso nso a, ị nwaala ka gị na ya kwụsị ịbụ enyi, ma o kwetaghị. E nwere ike ịsị na ọ bụzi ya na-atụrụ gị ụka. Ọ dị gị ka ya bụrụ na o nweghị ihe jikọrọ gị na ya.

      Ọ BỤ ụdị enyi a ka ọtụtụ ndị na sịga bụ. Otu nwaanyị aha ya bụ Earline, onye ṅụrụ sịga afọ iri ise, kwuru, sị: “Sịga na-enyere m aka karịa mmadụ ọ bụla. Ọ bụghị naanị na sịga bụ ezigbo enyi m, kama mgbe ụfọdụ, ọ bụ naanị enyi m nwere.” Ma, Earline mechara ghọta na sịga bụ enyi adịgboroja na enyi na-egbu enyi ya. N’eziokwu, e wezụga otu ihe, a gaara asị na ọ bụ Earline ka ihe ahụ e kwuru ná mmalite mere. Ọ kwụsịrị ịṅụ sịga mgbe ọ mụtara na Chineke kpọrọ ịṅụ sịga asị n’ihi na ọ na-emebi ahụ́ Chineke nyere anyị.—2 Ndị Kọrịnt 7:1.

      Otu nwoke aha ya bụ Frank kpebikwara na ya agaghị aṅụ sịga n’ihi na ọ chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ. Ma ka ihe dị ka ụbọchị abụọ ọ kwụsịrị ịṅụ sịga gachara, ịṅụ sịga gụsiwara ya ike nke na o sekpuuru ala na-achọgharị ma ọ̀ ga-ahụ isi sịga ọ ṅụfọrọ aṅụfọ dabara n’okpuru ihe o ji kụchie ala ụlọ ya ka o nwee ike mụnye ya ọkụ ṅụọ. Frank kwuru, sị: “Ozugbo ahụ ka m gwara onwe m na agaghị m emekata ṅụọ sịga ọzọ. Otú ahụ m si na-amanye aka n’ebe ruru unyi n’ihi na m na-achọ isi sịga m ga-aṅụ sọrọ m ezigbo oyi. Kemgbe ahụ, aṅụbeghị m sịga ọzọ.”

      Gịnị mere o ji esi ike ịkwụsị ịṅụ sịga? Ndị na-eme nnyocha achọpụtala ọtụtụ ihe mere o ji esi ike ịkwụsị ya: (1) Ihe ndị e ji eme sịga na-eri mmadụ ahụ́ otú ahụ ọgwụ ọjọọ si eri ahụ́. (2) Ọ na-ewe naanị tịnkọm tịnkọm asaa ka nikotin, bụ́ ihe na-adị na sịga, ruo n’ụbụrụ onye na-aṅụ sịga. (3) Ihe ọzọ na-eme ka sịga rie mmadụ ahụ́ bụ na onye ahụ na-aṅụkarị ya ma o riwe nri, ṅụwa mmanya, kparịtawa ụka, ma ọ chọwa iwepụ uche ya ná nsogbu nakwa ma o mewe ihe ndị ọzọ.

      Ma dị ka akụkọ Earline na Frank na-egosi, onye sịga riri ahụ́ ga-akwụsịli ịṅụ ya. Ọ bụrụ na ị na-aṅụ sịga, ya abụrụkwa na ị chọrọ ịkwụsị ya, ịgụ isiokwu ndị na-esonụ nwere ike inyere gị aka ịkwụsị ya.

  • Kpebisie Ike na Ị Ga-akwụsị Ya
    Teta!—2010 | Julaị
    • Kpebisie Ike na Ị Ga-akwụsị Ya

      “Ihe mbụ kacha mkpa ndị kwụsịrịla ịṅụ sịga mere bụ ikpebisi ike na ha ga-akwụsị ya.”—Akwụkwọ bụ́ “Stop Smoking Now!” (Kwụsị Ịṅụ Sịga Ugbu A)

      IHE akwụkwọ a na-ekwu bụ na ị chọọ ịkwụsị ịṅụ sịga, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, i kwesịrị ikpebisi ike na ị ga-akwụsị ya. Gịnị ga-enyere gị aka ikpebisi ike ịkwụsị ya? Ma é nweghị ihe ọzọ, chegodị uru ọ ga-abara gị ma ị kwụsị ịṅụ sịga.

      Ị gaghị na-emefusị ego gị. Onye na-aṅụ otu mkpọ sịga n’ụbọchị na-emefu ihe karịrị iri puku naịra isii n’afọ. “Amaghịdị m na m na-emefu nnukwu ego na sịga.”—Gyanu, onye bi na Nepọl.

      Ọ ga-eme ka i nwekwuo obi ụtọ ná ndụ gị. “Ọ bụ mgbe m kwụsịrị ịṅụ sịga ka ndụ m bidoro tọwa m ụtọ, ndụ m nọkwa na-aka mma kemgbe ahụ.” (Regina, onye bi na Saụt Afrịka) Mmadụ kwụsị ịṅụ sịga, ọ ga-abịa nụwakwuo ụtọ nri ma nụwakwuo ísì ihe. Onye ahụ na-amalitekwa nwewekwuo ume ma na-adịkwu mma n’anya.

      Ahụ́ ga-adịkwu gị mma. “Ịkwụsị ịṅụ sịga na-eme ka ahụ́ bido ozugbo dịwa ndị na-aṅụbu ya ezigbo mma, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị, n’agbanyeghị afọ ole ha dị.”—Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ịchịkwa na Igbochi Ọrịa n’Amerịka.

      Ị ga na-ejikwu aka gị ekpebi ihe ị ga-eme. “Ihe mere m ji kwụsị ịṅụ sịga bụ na achọghị m ka sịga na-atụrụ m ụka. Achọrọ m ka ọ bụrụ m na-agwa onwe m ihe m ga-eme.”—Henning, onye bi na Denmak.

      Ọ ga-abara ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị uru. “Ịṅụ sịga . . . na-akpatara ndị na-anọ gị nso ọrịa. . . . Nchọpụta ndị e mere na-egosi na ọrịa kansa akpa ume na ọrịa obi na-egbu ọtụtụ puku mmadụ kwa afọ n’ihi anwụrụ ọkụ sịga ha kutere mgbe ndị ọzọ na-aṅụ ya.”—Òtù Na-ahụ Maka Ọrịa Kansa n’Amerịka.

      Ị ga-eme ihe dị Onye kere gị mma. “Ndị m hụrụ n’anya, ka anyị sachapụ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́.” (2 Ndị Kọrịnt 7:1) “Nyefee Chineke ahụ́ unu dị ka àjà . . . dị nsọ, nke dị Chineke mma.”—Ndị Rom 12:1.

      “Ozugbo m ghọtara na Chineke achọghị ka anyị na-eme ihe ọ bụla ga-emebi ahụ́ anyị, ekpebiri m na agaghị m aṅụkwa sịga.”—Sylvia, onye bi na Spen.

      Ma ọ bụghị mgbe niile ka mmadụ ikpebisi ike na ya chọrọ ịkwụsị ịṅụ sịga na-eme ka onye ahụ kwụsị ya. O nwekwara ike ịdị mkpa ka ndị ọzọ nyere onye ahụ aka, ma ndị ezinụlọ ya ma ndị enyi ya. Olee otú ha nwere ike isi nye aka?

  • Chọọ Enyemaka
    Teta!—2010 | Julaị
    • Chọọ Enyemaka

      “Ọ [bụrụ] na mmadụ pụrụ imeri onye ọ bụ naanị ya, mmadụ abụọ gbakọrọ aka pụrụ iguzogide ya.”—Ekliziastis 4:12.

      Ọ BỤRỤ na ndị ọzọ enyere anyị aka, ọ ga-adịrị anyị mfe imeri onye iro ọ bụla, onye ọ sọkwara ya ma ọ bụ ihe ọ sọkwara ya ya bụrụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị chọrọ ịkwụsị ịṅụ sịga, ọ ga-adị mma ma ị gwa ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị ka ha nyere gị aka, ma ọ bụ gwa onye ọ bụla ọzọ ga-eji obi ya niile nyere gị aka ma nweere gị ndidi.

      I nwekwara ike ịgwa ndị kwụsịrịla ịṅụ sịga ka ha nyere gị aka, n’ihi na hanwa nwere ike ịka ghọta otú ọ dị gị ma kakwa nyere gị aka. Otu Onye Kraịst bi na Denmak, aha ya bụ Torben, sịrị: “Aka ndị ọzọ nyeere m baara m ezigbo uru.” Abraham, onye bi n’India, sịrị: “Ezigbo ịhụnanya ndị ezinụlọ m na Ndị Kraịst ibe m gosiri m nyeere m aka ịkwụsị ịṅụ sịga.” Ma ọ bụghị mgbe niile ka enyemaka ndị ezinụlọ na ndị enyi na-eme ka mmadụ kwụsị ịṅụ sịga.

      Otu nwoke aha ya bụ Bhagwandas, sịrị: “Aṅụrụ m sịga afọ iri abụọ na asaa, ma mgbe m mụtara ihe Baịbụl kwuru banyere omume ndị na-adịghị ọcha, ekpebiri m ịkwụsị ya. Agbalịrị m iselata aka n’ole m na-aṅụ. Akwụsịkwara m iso ndị mụ na ha na-akpa. Agakwara m ka ndị ụlọ ọgwụ nyere m aka. Ma o nweghị nke nwere isi. Ma n’otu abalị, agwara m Jehova Chineke otú obi dị m n’ekpere ma rịọ ya ka o nyere m aka ka m kwụsị ịṅụ sịga. Mgbe ahụzi ka m kwụsịrị ịṅụ ya!”

      Ihe ọzọ dị mkpa ị ga-eme bụ ijikere maka nsogbu ndị i nwere ike inwe ma ị chọọ ịkwụsị ịṅụ sịga. Gịnị bụ nsogbu ndị a? Isiokwu na-esonụ ga-agwa anyị.

      [Igbe dị na peeji nke 5]

      Ì KWESỊRỊ ỊṄỤRỤ YA ỌGWỤ?

      Ọgwụ ndị na-enyere mmadụ aka ịkwụsị ịṅụ sịga, dị ka plasta e tinyere nikotin, juziri ebe niile taa. Tupu i kpebie ma ị̀ ga-eji ọgwụ akwụsị ịṅụ sịga, chebara ajụjụ ndị a na-esonụ echiche:

      Olee uru ndị dị na ya? E kwuru na ọtụtụ n’ime ihe ndị ụlọ ọgwụ na-agwa onye chọrọ ịkwụsị ịṅụ sịga ka o mee bụ ihe ndị ga-eme ka ọ ghara inwe ọtụtụ nsogbu ndị na-achọ ịkwụsị ịṅụ sịga na-enwekarị. Ma ọ bụghị ndị ọkachamara niile kwetara na ihe ndị ahụ na-eme ka mmadụ kwụsị ịṅụ sịga kpamkpam.

      Olee ọghọm ndị dị na ya? Ụfọdụ ọgwụ ndị a na-aṅụ iji kwụsị ịṅụ sịga nwere ike ime ka agbọ nuwe mmadụ, mee ka onye ahụ na-ada mbà n’obi, ma ọ bụdị mee ka onye ahụ chewe echiche igbu onwe ya. Burukwa n’obi na ụfọdụ ọgwụ ndị e ji nikotin mee na-eri mmadụ ahụ́, nweekwa ike ịkpatara onye ahụ nsogbu otú sịga si eme. Nke bụ́ eziokwu bụ na ụdị ọgwụ ndị a ka nwekwara ike iri onye na-aṅụ ya ahụ́.

      Olee ụzọ ndị ọzọ e nwere ike isi kwụsị ịṅụ sịga? Otu nchọpụta e mere gosiri na ihe karịrị mmadụ asatọ n’ime mmadụ iri ọ bụla, bụ́ ndị kwụsịrịla ịṅụ sịga, kwuru na ihe ha mere bụ ịnọkata otu ụbọchị kwụsị ịṅụ sịga n’agaghị ṅụwara ya ọgwụ.

  • Jikere Maka Nsogbu Ndị Ị Ga-enwe
    Teta!—2010 | Julaị
    • Jikere Maka Nsogbu Ndị Ị Ga-enwe

      “Ihe mere m ji kpebie na m ga-akwụsị ịṅụ sịga bụ maka nwa ọhụrụ anyị. N’ihi ya, eji m akwụkwọ dee ‘Aṅụla Sịga’ mapawa ya n’ụlọ anyị. Ma naanị ka otu awa gachara, sịga gụwara m ka à na-anwụ anwụ. Ozugbo ahụ mụ amụnye otu sịga ọkụ.”—Yoshimitsu, onye bi na Japan.

      IHE a mere Yoshimitsu na-egosi na ọ naghị adịrị onye kpebiri ịkwụsị ịṅụ sịga mfe ịkwụsị ya. Nchọpụta ndị e mere na-egosikwa na ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ mmadụ itoolu n’ime mmadụ iri ọ bụla o siiri ike ịkwụsị na-alaghachi ṅụwakwa sịga. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị chọrọ ịkwụsị, o yiri ka ị̀ ga-aka eme nke ọma ma i jikere maka nsogbu ndị ị ga-enwe. Olee nsogbu ndị na-agbalị ịkwụsị ịṅụ sịga na-enwekarị?

      Agụụ ịṅụ sịga: Agụụ a na-akachakarị njọ n’ime ụbọchị atọ onye ahụ kwụsịrị ịṅụ sịga, ọ na-ebelatakwa ma ihe dị ka izu abụọ gafee. Otu onye na-aṅụbu sịga kwuru na n’oge mmadụ na-akwụsị ịṅụ sịga, “sịga gụsitụ onye ahụ ike, e meekwa ya akwụsị.” Ya bụrụdị na o meela ọtụtụ afọ mmadụ kwụsịrị ịṅụ sịga, onye ahụ nwere ike ịnọkata otu ụbọchị sịga agụsiwe ya ike. Ọ bụrụ na ọ gụọ gị otú ahụ, jide onwe gị, aṅụkwala sịga. Gbatụ nkịtị ka ihe dị ka nkeji ise gafee, agụụ sịga ahụ ga-akwụsị.

      Nsogbu ndị ọzọ i nwere ike inwe: Ndị ka kwụsịrị ịṅụ sịga na-achọpụta na ụra na-atụkarị ha, ma ọ bụ na uche ha anaghị adịkarị n’ihe ha na-eme, nakwa na ha na-ebukwu ibu. Ha nwekwara ike ịchọpụta na ahụ́ na-egbukarị ha mgbu, na-akọkarị ha ọkọ, ọsụsọ ana-agbakarị ha, ha ana-akwakarịkwa ụkwara. Ha na-achọpụtakwa na iwe na-ewekarị ha, ha anaghịkwa enwere ndị ọzọ ndidi, ma ọ bụdị na ha na-adakarị mbà n’obi. Ma, ọtụtụ n’ime nsogbu ndị a na-akwụsị n’ime izu anọ ma ọ bụ izu isii.

      N’oge nsogbu a, e nwere ihe ụfọdụ ị ga-eme ga-enyere gị aka. Dị ka ihe atụ:

      ● Na-ewepụtakwu oge na-ehi ụra.

      ● Na-aṅụ mmiri ma ọ bụ juus mgbe niile. Na-eri nri na-enye ihe n’ahụ́.

      ● Na-emega ahụ́ otú kwesịrịnụ.

      ● Na-eku ume nke ọma, ma were ya na ikuku ị na-ekuru dị ezigbo ọcha.

      Ihe ndị nwere ike ime ka sịga gụwa gị: Ihe ndị a bụ ihe ndị ọ na-abụ i mewe ma ọ bụ i cheta, ha emee ka sịga gụwa gị. Dị ka ihe atụ, ọ̀ na-abụ ị ṅụwahaala mmanya gị aṅụwa sịga? Ya bụrụ otú ahụ, ugbu a ị na-agbalị ịkwụsị ịṅụ sịga, egbula oge ma ị ṅụwa mmanya. Ka oge na-aga, ị ga-enwe ike imeda obi ṅụwakwa mmanya gị otú i si chọọ.

      Ihe a e kwuru gosiri na ọtụtụ afọ gachagodị, e nwere ihe ụfọdụ ọ ga-abụ i mewe, ịṅụ sịga agụwa gị. Torben, onye anyị kwuru okwu ya na mbụ, sịrị: “O ruola afọ iri na itoolu m kwụsịrị ịṅụ sịga, ma ọ ka na-abụ m ṅụwahaala kọfị n’oge anyị ji ezu ike n’ebe m na-arụ ọrụ, ịṅụ sịga agụwa m.” Ma dị ka ọ na-adị ọtụtụ ndị, ka oge na-aga, otú ahụ sịga na-esi agụ gị ma i mewe ihe ụfọdụ ga-eji nwayọọ nwayọọ kwụsị.

      Ma ọ bụghị otú ahụ ka ọ na-adị ma a bịa ná mmanya na-aba n’anya. Nke bụ́ eziokwu bụ na ị chọọ ịkwụsị ịṅụ sịga, o nwere ike ịdị mkpa na ị ga-akwụsịcha ịṅụ mmanya ma zere ebe ndị e nwere ike inye gị ya, n’ihi na ọtụtụ ndị kwụsịrịla ịṅụ sịga na-ebidokwa ṅụwa ya ma ha ṅụwa mmanya. Gịnị mere o ji adị otú ahụ?

      ● Obere mmanya na-emedị ka ịṅụ sịga tọwakwuo onye na-agbalị ịkwụsị ịṅụ sịga ụtọ.

      ● A na-aṅụkarị sịga n’ebe a na-aṅụ mmanya.

      ● Mmanya na-eme ka mmadụ ghara iche echiche nke ọma ma mewe ihe ọ na-agaraghị eme mgbe anya doro ya. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na ‘mmanya na-anapụ ezi uche.’—Hosia 4:11.

      Ndị gị na ha na-anọ: Na-ahọ ndị gị na ha ga na-akpa na ndị gị na ha na-anọ. Dị ka ihe atụ, hụ na gị na ndị na-aṅụ sịga ma ọ bụ ndị ga-enye gị sịga ka ị ṅụọ anaghị anọkarị. Na-agbara ndị na-achị gị ọchị ọsọ ma ọ bụ ndị na-ama gị njakịrị maka na ị na-agbalị ịkwụsị ịṅụ sịga.

      Otú obi na-adị gị: Otu nchọpụta e mere gosiri na mmadụ abụọ n’ime mmadụ atọ ọ bụla, bụ́ ndị ṅụrụ sịga mgbe ha na-agbalị ịkwụsị ya, ṅụrụ ya mgbe iwe ji ha ma ọ bụ mgbe otu ihe na-echegbu ha. Ọ bụrụ na iwe ma ọ bụ ihe ọzọ mere ka sịga gụwa gị, chọọ ihe ọzọ ị ga-eme ka obi gị pụọ na sịga. I nwere ike ṅụọ mmiri, taa chịngọm, ma ọ bụ gagharịtụ. Gbalịa ka i cheta ihe ndị ga-eme gị obi ụtọ, i nwedịrị ike ịrịọ Chineke n’ekpere ka o nyere gị aka ma ọ bụ chọta otu ebe na Baịbụl gụọ.—Abụ Ọma 19:14.

      Ihe Ndị Ị Na-ekwesịghị Ịgwa Onwe Gị

      ● Ka m kpụrụtụ anwụrụ ọkụ ya naanị otu ugboro.

      Nke bụ́ eziokwu: Naanị otu ugboro ahụ ị kpụrụtụụrụ ya nwere ike ime ka ụfọdụ ihe dị n’ụbụrụ gị, nke na-eme ka sịga na-agụ gị, rụwakwa ọrụ ruo awa atọ. Nke a na-emekarị ka mmadụ bidokwa ṅụwa sịga.

      ● Ịṅụ sịga na-enyere m aka idi nsogbu ndị m nwere.

      Nke bụ́ eziokwu: Nchọpụta ndị e mere na-egosi na sịga na-emedị ka mmadụ bido chegbuwekwuo onwe ya mgbe o nwere nsogbu. Ihe mere o ji adị ka ịṅụ sịga ọ̀ na-enyere gị aka idi nsogbu gị nwere ike ịbụ n’ihi na ọ na-ebelata nsogbu ụfọdụ ịkwụsị ịṅụ sịga na-akpatara gị.

      ● Ọ dịla anya m ṅụwara sịga, agaghị m akwụsịli ya.

      Nke bụ́ eziokwu: Mmadụ ịgwa onwe ya na ya agaghị emeli ihe ọ chọrọ ime na-eme ka ike gwụ onye ahụ ime ya. Baịbụl kwuru, sị: “Ì nwewo obi ịda mbà n’ụbọchị ahụhụ? Ike gị ga-adị ntakịrị.” (Ilu 24:10) N’ihi ya, echekwala na ị gaghị akwụsịli ya. Onye ọ bụla chọrọ ịkwụsị ịṅụ sịga n’eziokwu ma mee ihe ndị a tụụrụ ya aro ka o mee, dị ka ihe ndị a kọwara na magazin a, ga-akwụsịli ịṅụ sịga.

      ● Nsogbu ịkwụsị ịṅụ sịga na-akpatara m karịrị akarị.

      Nke bụ́ eziokwu: Ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ nsogbu onye na-agbalị ịkwụsị ịṅụ sịga na-enwe, ma nsogbu ndị ahụ na-ebelata ma izu ole na ole gafee. N’ihi ya, nọgide n’ihe i kpebiri ime! Ọ bụrụ na sịga agụwa gị ma ọnwa ụfọdụ ma ọ bụ afọ ụfọdụ gachaa, gba nkịtị ka nkeji ole na ole gafee, ọ ga-emecha kwụsị—ma ọ bụrụ na ị kpaghị sịga aka.

      ● Isi anaghị akpakọ m ọnụ.

      Nke bụ́ eziokwu: Ọ bụrụ na e nwere ọrịa mere na isi anaghị akpakọ gị ọnụ, ya abụrụkwa na ị na-anara ọgwụ maka ya, gwa dọkịta gị ka o nyere gị aka ịkwụsị ịṅụ sịga. Obi ga-adị ya mma inyere gị aka. O nwere ike ileba anya n’ọgwụ ndị ị na-aṅụ na mgbe i ji aṅụ ha iji hụ na ị kwụsịrị ịṅụ sịga.

      ● Ọ bụrụ na m kwụsị ịṅụ sịga mechaa ṅụọ ya, ọ ga-adị m ka o nweghị ihe m dị mma ya.

      Nke bụ́ eziokwu: Ọ bụrụ na i mechaa ṅụọ sịga ka ị na-agbalị ịkwụsị ya, otú ọ na-emekwa ọtụtụ ndị, echela na ị gaghị akwụsịli ya. Ike agwụla gị ná mbọ ị na-agba. Na i mechara ṅụọ sịga apụtaghị na ị gaghị akwụsịli ya. Ọ bụ mgbe ị kwụsịrị ịgba mbọ ka a ga-asị na o nweghị ihe ị dị mma ya. N’ihi ya, nọgide na-agba mbọ, ị ga-emecha kwụsị ya!

      Chebagodịrị ihe mere otu nwoke aha ya bụ Romualdo echiche. Nwoke a ṅụrụ sịga ruo afọ iri abụọ na isii, o ruokwala afọ iri atọ ọ kwụsịrịla ya. O dere sị: “O nwere mgbe m na-enweghịzi ike ịgụta ugboro ole m mechara ṅụọ sịga n’oge ahụ m na-agbalị ịkwụsị ya. Mgbe ọ bụla m ṅụrụ ya, ọ na-adị m ka o nweghị ihe m dị mma ya. Ma, ozugbo m kpebisiri ike ime ka mụ na Jehova Chineke dị ná mma ma rịọ ya ugboro ugboro ka o nyere m aka, emechara m kwụsị ya kpamkpam.”

      N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’ihe ole na ole ndị ọzọ nwere ike inyere gị aka ịkwụsị ịṅụ sịga ma mee ka i nwee obi ụtọ.

      [Igbe/Foto dị na peeji nke 7]

      ỤDỊ YA Ọ BỤLA NA-EGBU MMADỤ

      A na-eji ahịhịa anwụrụ eme ọtụtụ ihe. Ná mba ụfọdụ, a na-eredị ihe ụfọdụ e tinyere ahịhịa a n’ebe a na-ere nri ndị a na-ewere na ha na-edozi ahụ́, na-erekwa ha n’ebe a na-ere ọgwụ mgbọrọgwụ na mkpá akwụkwọ. Ma dị ka Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike si kwuo, “ụdị ọ bụla ahịhịa a dị na-egbu mmadụ.” Ọrịa ndị ahịhịa anwụrụ na-akpata, dị ka ọrịa kansa na ọrịa obi, nwere ike igbu mmadụ. Ọ bụrụ na nwaanyị dị ime na-aṅụ sịga, o nwere ike imerụ nwa o bu n’afọ ahụ́. Olee ihe dị iche iche a na-ejikarị ahịhịa anwụrụ emepụta?

      Bidi: A na-ahụkarị ụdị sịga a ná mba ndị dị n’Eshia. Ọ na-adị obere, a na-ejikwa aka afụkọta ya. Ụdị sịga a nwedịrị ihe ndị na-egbu mmadụ karịa sịga nkịtị.

      Nke e gwere egwe: Otú e si eme ụdị nke a bụ igweri ahịhịa anwụrụ ma jiri nke a na-egwerighị egweri ma ọ bụ akwụkwọ e ji ahịhịa a mee fụkọta ya. E nwedịrị ike ịṅụ ụdị a na-amụnyeghị ya ọkụ.

      Kritek: A na-ahụkarị ụdị sịga a ná mba Indonisha. Ihe abụọ e ji eme ụdị sịga a bụ ahịhịa anwụrụ na ihe ndị na-esi ísì ụtọ. Ụdị sịga a nwere ihe ndị na-egbu mmadụ karịa sịga nkịtị.

      Ọkpọkọ: Ịṅụ ọkpọkọ akaghị ịṅụ sịga mma, n’ihi na nke ọ bụla mmadụ ṅụrụ nwere ike ịkpatara onye ahụ ọrịa kansa ma ọ bụ ọrịa ndị ọzọ.

      Ndị nke na-enweghị anwụrụ ọkụ: Ụdị ndị so na ha bụ ahịhịa anwụrụ a na-ata ata, ụtaba, na ụdị nke a na-akpọ gutkha bụ́ nke a na-ahụ n’ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Eshia. Nikotin dị n’ihe ndị a na-esi n’ọnụ abanye mmadụ n’ọbara. Ụtaba na ihe ndị yiri ya na-egbu mmadụ otú ahụ ihe ndị ọzọ e ji ahịhịa anwụrụ mee si egbu.

      Ọkpọkọ ndị a na-etinye mmiri (ndị a na-akpọ bong, hookah, narghile, shisha): Ndị na-aṅụ ụdị ọkpọkọ a na-etinye ya mmiri ka anwụrụ ọkụ ha ga-ekuru bu ụzọ si ná mmiri ahụ gafee tupu ha ekuru ya. Ma nke ahụ agaghị eme ka ihe na-egbu mmadụ dị na ọkpọkọ ahụ ghara ịkpatara onye na-aṅụ ya ọrịa kansa ma o ruo n’akpa ume ya.

      [Igbe/Foto dị na peeji nke 8]

      INYERE ONYE NA-AGBALỊ ỊKWỤSỊ ỊṄỤ SỊGA AKA

      ● Akatọla ya. Ịja ya mma na inye ya onyinye maka oge ndị ọ na-aṅụghị sịga ga-aka aba uru karịa ịbara ya mba na ịgwakasị ya okwu ahụ́. Ọ ka mma ikwu ihe dị ka, “Ama m na ị ga-emecha kwụsị ya ma ị gbalịkwuo” karịa ịsị “Ị̀ ṅụwakwala ya ọzọ?”

      ● Na-agbaghara ya. Hụ na ị naghị ewe iwe ma onye ahụ wesa gị iwe ma ọ bụ baara gị mba. Jiri olu ọma gwa ya ihe dị ka, “Ama m na o siri ike omume, ma obi dị m ụtọ na ị na-eme ya.” Ya enwekwala mgbe ị ga-asị ya, “Achọpụtara m na obi na-aka adị gị mma oge ahụ ị na-aṅụkarị sịga!”

      ● Bụrụ ezigbo enyi. Baịbụl kwuru, sị: “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.” (Ilu 17:17) N’ihi ya, gbalịa na-enwere onye ahụ ndidi ma na-egosi ya na ị hụrụ ya n’anya “mgbe niile,” oge ọ sọkwara ya ya bụrụ ma ọ bụ otú ọ sọkwara obi dịrị ya.

  • Ị Ga-akwụsịli Ya!
    Teta!—2010 | Julaị
    • Ị Ga-akwụsịli Ya!

      OGE eruola mgbe ị ga-enwe “obi ike, meekwa ihe.” (1 Ihe E Mere 28:10) Olee ihe ndị ọzọ ga-enyere gị aka ịkwụsị ịṅụ sịga?

      Detuo ụbọchị ọ ga-abụ. Ngalaba Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike na Ọdịmma Ọhaneze n’Amerịka tụrụ aro na ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịkwụsị ịṅụ sịga, ụbọchị mbụ onye ahụ ga-akwụsị ya kwesịrị ịbụ n’ime izu abụọ o kpebichara ya. N’oge ahụ, ọ ka ga-adị gị ọkụ n’obi ime ya. Kanye ihe n’ụbọchị ahụ na kalenda gị, gwa ndị enyi gị ihe i kpebiri ime, hụkwa na i bidoro ya n’ụbọchị ahụ i kwuru, ihe ọ sọkwara ya mee.

      Dee ihe ndị i kpebiri n’otu kaadị. Ihe ndị i nwere ike ide na kaadị ahụ bụ ihe ndị a e dere n’okpuru ebe a na ihe ọ bụla ọzọ nwere ike ime ka obi sikwuo gị ike ịkwụsị ya:

      ● Ihe mere i ji chọọ ịkwụsị

      ● Nọmba ekwe ntị ndị ị ga-akpọ mgbe sịga gụsiwere gị ike

      ● Ihe ndị ọ ga-abụ i cheta ha enyere gị aka ime ihe i kpebiri, i nwedịrị ike idepụta amaokwu Baịbụl ndị dị ka Ndị Galeshia 5:22, 23

      Hụ na ị na-eji kaadị a aga ebe ọ bụla ị na-aga, na-agụkwa ya ugboro ugboro n’ụbọchị. Ị kwụsịgodị ịṅụ sịga, ahapụla kaadị ahụ, na-agụgharị ihe ndị ahụ i dere mgbe ọ bụla sịga gụwara gị.

      Aṅụla sịga n’oge ndị i ji aṅụ ya. Tupu ụbọchị ahụ i kpebiri ịkwụsị ịṅụ sịga eruo, gbalịa ka ị ghara ịṅụ sịga n’oge ndị i ji aṅụ ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ na-abụ i sihaala n’ụra bilie gị aṅụọ sịga, gbalịa ka ị ghara ịṅụ sịga ruo mgbe ọ gafere otu awa ma ọ bụ karịa. Ọ bụrụ na ọ na-abụ i riwe nri ma ọ bụ i richahaala nri gị aṅụọ sịga, kwụsị ịṅụ ya mgbe ahụ. Agakwala ebe ndị ọzọ na-aṅụ sịga. Mgbe naanị gị nọ, mụwa otú ị ga-esi agwa onye nyere gị sịga, sị: “I meela, agaghị m aṅụ. Akwụsịla m ịṅụ sịga.” I mee ihe ndị a, ha ga-eme ka ị dị njikere maka ụbọchị ahụ i kpebiri ịkwụsị. Ọ ga-emekwa ka i cheta na n’oge na-adịghị anya ị ga-abụzi onye na-aṅụbu sịga.

      Ihe ndị ọzọ ị ga-eme. Ka ụbọchị ahụ na-eru nso, zụta ihe ndị ị ga-eji na-atagharị ọnụ, dị ka karọt, chịngọm, ahụekere, na ihe ndị ọzọ. Chetara ndị enyi gị na ndị ezinụlọ gị ụbọchị ọ ga-abụ, gwakwa ha otú ha ga-esi enyere gị aka. Tupu ụbọchị ahụ eruo, tụfuo ihe ndị i ji etinye ntụ sịga, ihe i ji amụnye sịga ọkụ, na ihe ndị ọzọ nwere ike ime ka sịga gụwa gị, dị ka sịga ndị dị n’ụlọ gị, n’ụgbọala gị, n’akpa uwe gị, ma ọ bụkwanụ n’ebe ị na-arụ ọrụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dị mfe iwere sịga i nwere n’ụlọ gị ma ọ bụ n’akpa gị ṅụọ karịa ịgwa enyi gị ka o nye gị sịga ma ọ bụ gịnwa ịga zụrụ ya. Ihe ọzọkwa bụ, na-arịọ Chineke mgbe niile ka o nyere gị aka, kpesiwekwa ekpere ike mgbe ahụ ị kwụsịrị ịṅụ sịga ka ị ghara ịlaghachi na ya ọzọ.—Luk 11:13.

      E nweela ọtụtụ ndị ha na sịga, bụ́ enyi adịgboroja, nke na-egbu mmadụ, mechara “see okwu.” Ị ga-emelikwa ya. I mee ya, ahụ́ ga-esikwu gị ike, ị ga-enwerekwa onwe gị ma kwụsị ịbụ ohu sịga.

      [Foto dị na peeji nke 9]

      Na-eji kaadị ahụ i dere ihe ndị i kpebiri na-aga ebe ọ bụla ị na-aga, na-agụkwa ya ugboro ugboro n’ụbọchị

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya