-
Gịnị Mere M Ga-eji Na-eme Ihe Baịbụl Kwuru?Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
-
-
ISI NKE 34
Gịnị Mere M Ga-eji Na-eme Ihe Baịbụl Kwuru?
Ka e were ya na gị na ụmụ agbọghọ abụọ gara ebe a na-ere nri n’ụlọ akwụkwọ unu iri nri ehihie, otu nwa okorobịa bịara ọhụrụ n’ụlọ akwụkwọ unu abata.
Otu n’ime ha asị gị: “Ị̀ ma na Emeka hụrụ gị n’anya? Ị̀ hụkwara ụdị anya ọ na-ele gị? Anya ya ekweghị apụ apụ n’ebe ị nọ!”
Nwa agbọghọ nke ọzọ abịakwuo nso, takwunyere gị, sị: “Ị̀ makwa na o nwebeghị enyi nwaanyị?”
Ị ma na ha kwuru eziokwu. A sị ka e kwuwe, Emeka kpọrọ gị n’ụbọchị gara aga ka ị bịa rie oriri n’ụlọ ya. Ma i kweghị aga, n’agbanyeghị na ọ gụrụ gị agụụ ịga za òkù ahụ.
Nwa agbọghọ mbụ ahụ agwa gị okwu ọzọ mgbe ị ka na-atụgharị uche.
Ya asị gị: “A sị na enweghị m enyi nwoke, o nweghị ihe gaara eme ka m ghara imeta Emeka enyi.”
Ya eju ya anya, ya ana-ele gị. Ị ma ihe ọ chọrọ ikwu.
Ya asị gị: “Bịadị, gịnị mere i nweghị enyi nwoke?”
Ị naghị achọ ka a jụọ gị ajụjụ ahụ! Nke bụ́ eziokwu bụ na ị chọrọ inwe enyi nwoke. Ma a gwara gị na ọ kacha mma ka i chere ruo mgbe i jikeere ịlụ di tupu gị na nwoke akpawa. A sị nnọọ na ọ bụghị . . .
Nwa agbọghọ nke ọzọ asị gị: “Ọ̀ kwa n’ihi chọọchị unu ahụ?”
Gị asị n’obi gị: ‘Olee otú o si mara ihe dị m n’obi?’
Ya achịa gị ọchị, sị: “Mgbe niile gị na Baịbụl! Gịnị mere na ị gaghị ahapụtụ Baịbụl kporitụkwanụ ndụ mgbe ụfọdụ?”
Ò NWETỤLA mgbe a chịrị gị ọchị n’ihi na ị na-agbalị ime ihe Baịbụl kwuru? Ya bụrụ otú ahụ, i nwere ike na-eche na e nwere uru ị na-anaghị erite n’ihi ime ihe Baịbụl kwuru. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Deborah chere otú ahụ. O kwuru, sị: “Amalitere m iche na iwu Baịbụl na-eke mmadụ agbụ. Otú ndị enyi m n’ụlọ akwụkwọ si na-eme ihe ọ bụla sọrọ ha masịrị m.”
Ihe Ga-eme Ka Anya Doo Gị
Ọ bụghị mgbe niile ka mmadụ ga-echere ka ihe mee ya tupu ya amụta ihe. N’eziokwu, Baịbụl kwuru na mmadụ kwesịrị ịmụta ihe n’ihe mere ndị ọzọ, otú ahụ ọbụ abụ bụ́ Esaf mere. O nwere mgbe Esaf chere na iwu Chineke na-eke mmadụ agbụ. Ma anya doro ya mgbe o leruru ndụ ndị hapụrụ ụzọ Chineke anya. Esaf mechara chọpụta na ha nọ “n’ala na-amị amị.”—Abụ Ọma 73:18.
Buru nke ahụ n’uche tụlee ihe ụfọdụ n’ime ndị na-eto eto ndị hapụtụrụ iwu Baịbụl gaa kwaa iko kwuru.
● Gịnị mebiri echiche gị na omume gị?
Deborah: “Mgbe m nọ n’ụlọ akwụkwọ, ahụrụ m na onye ọ bụla nwere enyi nwoke na enyi nwaanyị. O yikwara ka hà na-enwe obi ụtọ. Mụ na ha nọrọ, m na-ahụ ka ha na-esusu ọnụ, na-amakụkwa ibe ha. Ọ na-adị m ka m̀ bịara nke m iche, dịkwa m ka m bụrụ ha. M na-ejikarị ọtụtụ awa mụrụ anya na-arọ nrọ ebe mụ na otu nwa okorobịa ihe ya dị mụ mma na-enwe mmekọahụ. O mere ka ọ gụsikwuo m ike ka mụ na ya nwee mmekọahụ.”
Mike: “M na-agụbu akwụkwọ ndị na-ekwu na mmekọahụ bụ ndụ, na-elekwa ihe na-akwado ya na TV. Iso ndị enyi m na-akọ banyere mmekọahụ mere ka ọ na-agụsi m agụụ ike. Naanị mụ na nwa agbọghọ nọrọ, m na-eche na anyị nwere ike na-adịda ibe anyị aka n’enweghị mmekọahụ, na m nwere ike ịkwụsị mgbe ọ bụla m chọrọ.”
Andrew: “Ile foto ndị gba ọtọ n’Ịntanet riri m isi. M malitere ịṅụ oké mmanya. M na-esokwa ndị ntorobịa na-adịghị eme ihe Baịbụl kwuru aga oriri na nkwari.”
Tracy: “N’ime obi m, ama m na inwe mmekọahụ mgbe m na-alụbeghị di adịghị mma, ma, akpọghị m ya asị. Ebughị m n’obi ịmalite inwe mmekọahụ mgbe m na-alụbeghị di, ma ejidelighị m onwe m. Mgbe m malitere, akọnuche m anaghị ama m ikpe.”
● Ụdị ndụ ahụ i biri ò mere ka i nwee obi ụtọ?
Deborah: “Ná mmalite, obi dịrị m ezigbo mma na mụ enwerela onwe m. Obi tọkwara m ụtọ na ụmụ agbọghọ ibe m na-elezi m anya ọma. Ma obi ụtọ ahụ adịteghị aka. Onwe m sọwara m oyi, dịzie m ka onye gara mụọ ihe ọjọọ, na onye tọgbọ chakoo. Akwara m mmakwaara na abụkwaghị m nwa agbọghọ na-amaghị nwoke.”
Andrew: “O mere ka ọ dịkwuoro m mfe ime ihe ọjọọ ọ bụla batara m n’obi. Ma, obi m nọkwa na-ama m ikpe. Onwe m gwụkwara m ike.”
Tracy: “Ịkwa iko mebiri oge agbọghọbịa m. Echere m na mụ na enyi m nwoke ga na-ekpori ezigbo ndụ. Ma anyị ekporighị ndụ. Anyị kpataara ibe anyị mwute, obi ọjọọ, na obi mgbawa. Kwa abalị, m na-ebe ezigbo ákwá n’ihe ndina m, na-ekwu na a sị na m ma, m gaara eme ihe Jehova kwuru.”
Mike: “Ọ malitere ịdị m ka ò nwere ihe nwụrụ n’ime m. M gbalịrị ileghara nsogbu omume m na-enye ndị ọzọ anya, ma o kweghị m. O wutere m na m nọ na-eme ihe na-agbawa ndị ọzọ obi n’ihi ndụ m na-ekpori.”
● Olee ndụmọdụ ị ga-enye ndị ntorobịa ndị chere na iwu Baịbụl na-eke mmadụ agbụ?
Tracy: “Na-eme ihe Jehova kwuru, ka ndị enyi gị bụrụkwa ndị na-eme otú ahụ. Ọ ga-eme ka i nwekwuo obi ụtọ.”
Deborah: “Ọ bụghị naanị gị ka ihe ị na-eme gbasara. Ọ gbasara ndị ọzọ. Ọ bụrụ na i leghara ndụmọdụ Chineke anya, ị ga-emebi onwe gị.”
Andrew: “Mgbe ị na-amabeghị ihe, ị ga-eche na otú ụmụaka ibe gị si ebi ndụ na-atọgbu onwe ya. Ọ ga-eme ka ị mụta àgwà ha. N’ihi ya, kpachara anya ná ndị ị na-emeta enyi. Tụkwasị Jehova obi, ị gaghịkwa akwa mmakwaara.”
Mike: “Ụfọdụ n’ime akụ̀ kacha akụ̀ Jehova nyere gị bụ ùgwù gị na ịbụ onye na-amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị. Ọ bụrụ na ị tụfuo onyinye ndị ahụ n’ihi na i jidelighị onwe gị, i reela ùgwù gị. Gwa papa gị na mama gị nakwa ndị ọzọ tozuru okè nsogbu gị. I mejọọ ihe, gwa ha ozugbo ma mezie ya. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe Jehova kwuru, obi ga-eru gị ala.”
Iwu Baịbụl Ọ̀ Na-eke Mmadụ Agbụ, ka Ọ̀ Na-echebe Mmadụ?
Jehova bụ ‘Chineke obi ụtọ,’ ọ chọkwara ka ị na-enwe obi ụtọ. (1 Timoti 1:11; Ekliziastis 11:9) E dere iwu ndị dị na Baịbụl ka ha baara gị uru. N’ezie, i nwere ike iche na ha kere gị agbụ n’ekweghị gị megharịa ahụ́. Ma n’eziokwu, iwu Baịbụl na-echebe gị ka ị ghara imerụ ahụ́, otú ahụ belt oche ụgbọala na-echebe mmadụ.
N’eziokwu, Baịbụl bụ akwụkwọ ị ga-atụkwasị obi. Ọ bụrụ na i kpebie ime ihe o kwuru, ọ bụghị naanị na ị ga-eme ka obi dị Jehova ụtọ, kamakwa, ọ ga-abara gị uru.—Aịzaya 48:17.
I nwere ike ịbụ enyi Chineke. Chọpụta otú ị ga-esi abụ ya.
AMAOKWU BAỊBỤL
“Mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị, Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru.”—Aịzaya 48:17.
NDỤMỌDỤ
Chee echiche otú ị ga-esi gosi nwanne gị ị tọrọ na amamihe dị n’iwu Baịbụl. Ịgwa ndị mmadụ ihe i kweere bụ otu ụzọ bara uru ị ga-esi mee ka ọ gbanye mgbọrọgwụ n’obi gị.
Ị̀ MA NA . . . ?
Imebi adịm ná mma gị na Jehova anaghị egbu oge, ma imezi ya nwere ike iwe gị ọtụtụ afọ.
IHE M GA-EME!
Ihe m ga-eme nke ga-enyere m aka ịghọta amamihe dị n’iwu Baịbụl bụ ․․․․․
Ọ bụrụ na ọ dịwa m ka m bụrụ ndị na-ebi ndụ ndị ụwa, ihe m ga-eme bụ ․․․․․
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․
GỊNỊ KA I CHERE?
● A bịa ná nsogbu imebi iwu Chineke na-akpata, gịnị mere mmadụ ichere ka ihe mee ya abụghị ụzọ kacha mma ọ ga-esi amụta ihe?
● Gịnị ka ị mụtara n’ihe Deborah, Mike, Andrew, na Tracy kwuru?
● Gịnị nwere ike ime ka ụfọdụ ndị chee na iwu Baịbụl na-eke mmadụ agbụ, ma gịnị mere ụdị echiche ahụ abaghị uru?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 285]
“Obi erughị ala mmadụ na-enwe mgbe ọ na-agbalị izochi ihe ọjọọ o mere na-aka mwute ọ ga-enwe mgbe a dọrọ ya aka ná ntị njọ.”—Donna
[Foto dị na peeji nke 288]
Iwu Baịbụl anaghị eme ka ị ghara inwe obi ụtọ; ọ na-echebe gị
-
-
Olee Otú M Ga-esi Abụ Enyi Chineke?Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
-
-
ISI NKE 35
Olee Otú M Ga-esi Abụ Enyi Chineke?
Ihe Mere otu nwa okorobịa aha ya bụ Jeremy mere ka ọ mụta na ịbụ enyi Chineke bara uru. O kwuru, sị: “Papa m hapụrụ ezinụlọ anyị mgbe m dị afọ iri na abụọ. N’otu abalị, anọ m n’ihe ndina m na-arịọ Jehova ka o mee ka papa m lọghachi.”
N’oge ahụ obi na-adịghị Jeremy mma, ọ malitere ịgụ Baịbụl. Mgbe ọ gụtara Abụ Ọma 10:14, o metụrụ ya nnọọ n’ahụ́. Amaokwu ahụ kwuru banyere Jehova, sị: “Ọ bụ gị ka onye ihe ọjọọ dabaara, bụ́ nwa na-enweghị nna, na-enyefe onwe ya. Gị onwe gị bụ onye na-enyere ya aka.” Jeremy kwuru, sị: “Ọ dị m nnọọ ka ọ̀ bụ m ka Jehova na-agwa okwu ahụ, na-eme ka m ghọta na ya bụ onye na-enyere m aka; na ya bụ Papa m. Ò nwere papa ọzọ m ga-enwe ga-aka ya?”
MA Ị̀ nọ n’ọnọdụ yiri nke Jeremy ma ọ bụ na ị nọghị, Baịbụl kwuru na Jehova chọrọ ka ị bụrụ enyi ya. N’eziokwu, Baịbụl kwuru, sị: ‘Bịaruo Chineke nso, ọ ga-abịarukwa gị nso.’ (Jems 4:8) Chegodị echiche ihe okwu ahụ pụtara: N’agbanyeghị na i nweghị ike ịhụ Jehova Chineke anya, o nweghịkwa otú gị na ya si hara, ọ na-agwa gị ka ị bụrụ enyi ya!
Ma ka gị na Chineke nwee ike ịbụ enyi, ị ga-etinye mgbalị. Dị ka ihe atụ: Ọ bụrụ na i nwere okooko osisi na-eto n’ime ụlọ, ị ma na ọ naghị eto ma é lekọtaghị ya. Ị chọọ ka ọ na-eto nke ọma, ị ga na-agba ya mmiri mgbe niile, ma dewe ya ebe dị mma ọ ga-anọ na-eto. Ọ bụ otú ahụ ka ị ga-esi agbalị ma ị chọọ ka gị na Chineke bụrụ enyi. Olee otú ị ga-esi eme ka enyi gị na ya sie ike?
Uru Ịmụ Baịbụl Bara
Ige ntị na ikwurịta okwu bụ ihe abụọ dị mkpa ga-eme ka mmadụ abụọ bụrụ enyi. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma mmadụ chọọ ka ya na Chineke bụrụ enyi. Otú anyị si ege ntị n’ihe Chineke na-agwa anyị bụ ịgụ na ịmụ Baịbụl.—Abụ Ọma 1:2, 3.
N’eziokwu, o nwere ike ịbụ na ị naghị enwecha mmasị n’ịmụ ihe. Ọ na-akara ọtụtụ ndị na-eto eto mma ile TV, igwu egwuregwu kọmputa ma ọ bụ iso ndị enyi ha kpapụ kama ịmụ ihe. Ma, ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ enyi Chineke, ị ga-emerịrị ihe o kwuru. I kwesịrị ịmụ Okwu ya ma ọ bụrụ na ị ga-ege ya ntị.
Ma, echegbula onwe gị. Ịmụ Baịbụl ekwesịghị ịbụrụ gị ibu. I nwere ike ime ka ọ na-atọ gị ụtọ—a sịgodị na i chere na ị bụghị onye akwụkwọ. Ihe mbụ i kwesịrị ime bụ iwepụta oge ị ga-eji na-amụ ya. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Lais kwuru, sị: “Enwere m oge m ji amụ ihe. Ihe mbụ m na-eme kwa ụtụtụ bụ ịgụ otu isiakwụkwọ Baịbụl.” Nwa agbọghọ ọzọ dị afọ iri na ise aha ya bụ Maria kwuru oge ọzọ o ji agụ nke ya. Ọ sịrị: “Ana m agụtụ Baịbụl kwa abalị tupu mụ ehie ụra.”
Ị chọọ ịmalite ọmụmụ Baịbụl nke gị, lee ihe e dere na peeji nke 292. N’okpuru ebe a, dee mgbe ị ga-ewepụta ihe dị ka nkeji iri atọ ị ga-eji amụ Okwu Chineke.
․․․․․
Ide oge ị ga-eji amụ ya ka bụ mmalite. Ị malitehaala ịmụ Baịbụl, i nwere ike ịchọpụta na ịghọta ya anaghị adị mfe mgbe niile. I nwere ike ikweta ihe otu nwata nwoke dị afọ iri na otu aha ya bụ Jezreel ji obi ya niile kwuo. Ọ sịrị: “Ebe ụfọdụ na Baịbụl na-esi ike nghọta, ọ naghịkwa atọ ụtọ.” Ọ bụrụ otú ọ na-adị gị, jisie ike. Mgbe ọ bụla ị mụwara Baịbụl, were oge ahụ dị ka oge i ji na-ege enyi gị bụ́ Jehova Chineke ntị. Ihe ị ga-eme ka ịmụ Baịbụl na-atọ gị ụtọ ma baara gị uru bụ ịgbalịsi ike na-amụ ya!
Ekpere Dị Mkpa
Ekpere bụ ụzọ anyị si agwa Chineke okwu. Chegodị echiche otú ekpere si bụrụ onyinye magburu onwe ya! I nwere ike ịkpọku Jehova Chineke mgbe ọ bụla ma n’ehihie ma n’abalị. Ọ dị njikere ige gị ntị mgbe niile. Nke ka nke, ọ chọrọ ịnụ ihe ị ga-agwa ya. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gbaa gị ume, sị: ‘N’ihe niile, jiri ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe ị na-arịọ.’—Ndị Filipaị 4:6.
Dị ka e kwuru n’amaokwu ahụ, e nwere ọtụtụ ihe i nwere ike ịgwa Jehova. I nwere ike ịgwa ya nsogbu gị na ihe na-echegbu gị. Ihe ndị ọzọ i nwere ike ịgwa ya bụ ihe ndị o meere gị. A sị ka e kwuwe, ọ̀ bụ na ị naghị ekele ndị enyi gị ma ha meere gị ihe ọma? I nwekwara ike ikele Jehova maka ihe ọma ndị o meere gị, bụ́ ihe enyi gị ọ bụla na-enweghị ike imere gị.—Abụ Ọma 106:1.
N’okpuru ebe a, dee ihe ụfọdụ Jehova meere gị mere i ji na-ekele ya.
․․․․․
O doro anya na mgbe ụfọdụ, e nwere ihe ga na-echu gị ụra. Abụ Ọma 55:22 kwuru, sị: “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị. Ọ dịghị mgbe ọ ga-ekwe ka onye ezi omume maa jijiji.”
N’okpuru ebe a, dee ihe ụfọdụ na-enye gị nsogbu ị chọrọ ịgwa Jehova n’ekpere.
․․․․․
Ahụmahụ
E nwere ihe ọzọ ị na-ekwesịghị ichefu n’enyi gị na Chineke bụ. Devid bụ́ ọbụ abụ dere, sị: “Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.” (Abụ Ọma 34:8) Mgbe Devid dere abụ nke iri atọ na anọ ahụ, ọ ka si ná nsogbu gaara ata isi ya pụta. Ọ nọ na-agba ọsọ ndụ ka Eze Sọl ghara igbu ya—nke bụkwanụ ezigbo nsogbu n’onwe ya. Ma, ọ gbagara n’obodo ndị iro ya bụ́ ndị Filistia. Mgbe Devid chọpụtara na a gawala igbu ya, ọ kpachaara anya mee ka onye ara, sikwa otú ahụ lagbụrụ.—1 Samuel 21:10-15.
Devid ekwughị na ihe mere o ji lagbụrụ bụ na ya ma ihe. Kama, o kelere Jehova maka ya. Tupu ya edee Abụ Ọma 34:8 ahụ, o dere, sị: “Ajụrụ m Jehova ase, o wee za m, ọ napụtakwara m n’ihe niile na-emenye m ụjọ.” (Abụ Ọma 34:4) N’ihi ya, ọ bụ ihe ahụ mere Devid mere o ji gwa ndị mmadụ ka ha ‘detụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.’a
Ì nwere ike icheta otu ihe metụrụla ná ndụ gị nke na-egosi na Jehova na-elekọta gị? Ya bụrụ otú ahụ, dee ya n’okpuru ebe a. Echela na ọ ga-abụrịrị ọrụ ebube. I nwere ike icheta ihe ọma na-emere ndị mmadụ kwa ụbọchị, nke ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịbụ ihe ndị mmadụ na-anaghị eji akpọrọ ihe.
․․․․․
Ma eleghị anya, papa gị na mama gị akụzierela gị Baịbụl. Ya bụrụ otú ahụ, nke gị ka mma. N’agbanyeghị nke ahụ, i kwesịrị ime ka gị na Chineke bụrụ enyi. Ọ bụrụ na i mebeghị otú ahụ, i nwere ike iji ihe e kwuru n’isiokwu a malite. Jehova ga-agọzi mgbalị i mere. Baịbụl kwuru, sị: ‘Na-arịọ, a ga-enye gị; na-achọ, ị ga-achọta.’—Matiu 7:7.
GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A NA NWANNE AKWỤKWỌ A E BU ỤZỌ BIPỤTA, ISI NKE 38 NA NKE 39
Ọ̀ na-esiri gị ike ịgwa ndị ọzọ banyere Chineke? Chọpụta ihe ga-eme ka obi sie gị ike ịgwa ndị mmadụ ihe i kweere.
[Ihe odide ala ala peeji]
a Otú Baịbụl ọzọ si sụgharịa ‘detụ ire ma hụ’ bụ “jiri aka gị chọpụtara onwe gị.”—Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.
AMAOKWU BAỊBỤL
“Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.”—Matiu 5:3.
NDỤMỌDỤ
Ọ bụrụ na ị gụọ ihe dị ka peeji anọ na Baịbụl kwa ụbọchị, ị ga-agụcha Baịbụl dum n’ihe dị ka otu afọ.
Ị̀ MA NA . . . ?
Ọgụgụ ị na-agụ akwụkwọ a ma na-eme ihe si na Baịbụl e dere na ya na-egosi na Jehova hụrụ gị n’anya.—Jọn 6:44.
IHE M GA-EME!
Ka m nwee ike iritekwu uru na Baịbụl m na-amụ, ihe m ga-eme bụ ․․․․․
Ka m nwee ike ịna-ekpechikwu ekpere anya, ihe m ga-eme bụ ․․․․․
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․
GỊNỊ KA I CHERE?
● Olee ihe ị ga-eme ka ọmụmụ Baịbụl gị na-atọkwu gị ụtọ?
● Gịnị mere Jehova ji ege ntị n’ekpere ụmụ mmadụ na-ezughị okè?
● Olee otú ị ga-esi eme ka ekpere gị ka mma?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 291]
“Mgbe m ka dị obere, ana m ekwukarị otu ihe mgbe ọ bụla m na-ekpe ekpere. Ugbu a, ana m agbalị itinye ihe ọma na ihe ọjọọ ndị mere n’ụbọchị n’ekpere. Ebe ọ bụ na ụbọchị niile anaghị abụ otu, ọ na-eme ka m ghara ịna-ekwu otu ihe mgbe ọ bụla m na-ekpe ekpere.”—Eve
[Igbe na Foto dị na peeji nke 292]
Otú Ị Ga-esi Agụ Baịbụl
1. Họrọ otu akụkọ ị chọrọ ịgụ na Baịbụl. Kpekuo Chineke ekpere ka o nye gị amamihe ị ga-eji aghọta ya.
2. Meda obi gụọ akụkọ ahụ. Agbala ya ọsọ. Mgbe ị na-agụ ya, jiri anya nke uche gị na-ahụ ihe ị na-agụ. Were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ na-eme, ya bụ, gbalịa ịhụ ihe na-emenụ, ịnụ olu ndị na-ekwu okwu n’akụkọ ahụ, ịnụ ísì ihe dị n’ebe ahụ, ịnụ ụtọ nri e kwuru okwu ya n’ebe ahụ na ihe ndị ọzọ. Gbalịa mee ka akụkọ ahụ dị gị ka ihe na-eme mgbe ahụ!
3. Chebara ihe ị gụrụ mgbe ahụ echiche. Jụọ onwe gị ajụjụ ndị a:
● Gịnị mere Jehova ji mee ka e dee akụkọ a n’Okwu ya?
● Olee ndị e kwesịrị iṅomi n’akụkọ a, oleekwa ndị bụ́ ihe atụ ịdọ aka ná ntị?
● Olee ihe bara uru m kwesịrị ịmụta n’akụkọ a m gụrụ?
● Gịnị ka akụkọ a na-akụziri m banyere Jehova na otú o si eme ihe?
4. Kpekuo Jehova ekpere dị nkenke. Gwa ya ihe ị mụtara n’akụkọ ahụ ị gụrụ na Baịbụl na otú ị chọrọ isi eme ya eme. Na-ekele Jehova mgbe niile maka onyinye o nyere gị, nke bụ́ Okwu ya bụ́ Baịbụl Nsọ!
[Foto]
“Okwu gị bụ oriọna nke na-enye ụkwụ m ìhè, bụrụkwa ìhè na-enwu n’okporo ụzọ m.” —Abụ Ọma 119:105.
[Igbe na Foto dị na peeji nke 294]
Kpebie Ihe Kacha Mkpa
Ị̀ na-enwe efe ikpe ekpere na ịmụ Baịbụl? Ọ bụrụ na ị naghị enwe efe, ihe nwere ike ịkpata ya bụ ihe i weere dị ka ihe kacha mkpa.
Megodị ihe a: Were otu bọket, tinye ya ụfọdụ nkume buru ibu. Wụjuo bọket ahụ ájá. Ihe juziri bọket ahụ bụ nkume na ájá.
Ugbu a, wụpụ nkume ndị ahụ na ájá ahụ n’ala, ma dewe ha otu ebe. Mee ihe ahụ i mere mbụ n’ụzọ ọzọ: Buru ụzọ wụjuo ájá na bọket ahụ, gbalịzie itinye nkume ndị ahụ n’ime ya. Ọ̀ kwa ha abaghị na bọket ahụ? Ihe kpatara ya bụ na i bu ụzọ wụnye ájá na bọket ahụ ugbu a.
Gịnị ka i kwesịrị ịmụta n’ihe a? Baịbụl kwuru, sị: “Chọpụta ihe ndị ka mkpa.” (Ndị Filipaị 1:10) Ọ bụrụ na i buru ụzọ na-eme ihe ndị na-adịchaghị mkpa dị ka ntụrụndụ, ọ ga-adị gị ka i nweghị oge ị ga-eji eme ihe ndị kacha mkpa, ya bụ, ihe gbasara ofufe Chineke. Ma ọ bụrụ na i mee ihe ahụ Baịbụl kwuru, ị ga-ahụ na ị ga-enwe oge ị ga-eji eme ma ihe gbasara ofufe Chineke ma inwe ntụrụndụ. Ihe ka mkpa bụ ihe i bu ụzọ tinye na bọket gị!
[Foto dị na peeji nke 290]
Otú ahụ e si elezi okooko osisi na-eto n’ime ụlọ anya, ọ bụ otú ahụ ka mmadụ ga-esi eme ka enyi ya na Chineke bụ sie ike
-
-
Olee Otú M Ga-esi Akọwara Ndị Ọzọ Ihe M Kweere Banyere Chineke?Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
-
-
ISI NKE 36
Olee Otú M Ga-esi Akọwara Ndị Ọzọ Ihe M Kweere Banyere Chineke?
Olee ihe nwere ike ime ka ị ghara ịgwa nwa klas unu ihe i kweere?
□ Amachaghị Baịbụl
□ Ịtụ ụjọ na a ga-achị gị ọchị
□ Amaghị otú e si amalite nkwurịta okwu
Olee otú i chere ga-akacha adịrị gị mfe ịgwa mmadụ ihe i kwere?
□ Ịgwa otu nwa klas unu okwu
□ Ịgwa ụmụ klas unu niile okwu n’otu mgbe
□ Ide edemede banyere ihe i kweere na Baịbụl
Dee aha nwa klas unu i chere ọ ga-amasị ka gị na ya kwurịta okwu banyere Baịbụl ma ọ bụrụ na ị ma otú ị ga-esi amalite ya. ․․․․․
O NWERE ike ịbụ na ụmụ akwụkwọ ibe gị anaghị ekwukarị okwu gbasara Chineke. I kwuo banyere ihe ndị ọzọ dị ka egwuregwu, uwe ma ọ bụ okwu nwoke na nwaanyị, onye ọ bụla ga-achọ itinye ọnụ. Ma i kwutezie okwu banyere Chineke, ebe niile ajụọ oyi ozugbo.
Ọ bụghị na ụmụaka ibe gị ekweghị na Chineke; ọtụtụ n’ime ha kweere na ya. Ma ụfọdụ na-eme ihere ikwu ihe banyere ya. Ha nwere ike iche, sị: ‘Ọ bụghị ebe a nọ.’
Gịnwa kwanụ?
Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịgwa ụmụ akwụkwọ ibe gị okwu banyere Chineke, ọ bụghị ihe ijuanya. O nweghị onye chọrọ ịbụ onye a jụrụ ajụ, ma ya fọdụzie ịbụ onye a na-achị ọchị! Ụdị ihe ahụ ò nwere ike ime gị ma ọ bụrụ na ị gwa ndị ọzọ banyere ihe i kweere? Ee. N’aka nke ọzọ, ụmụaka ibe gị nwere ike ime ihe ga-eju gị anya. Ụfọdụ n’ime ha na-achọ ka a zaa ha ajụjụ ndị dị ka: Olee ihe ụwa a chọrọ ịghọ? na Gịnị mere nsogbu ji ju n’ụwa? Ha nwere ike ịchọ ka ụmụaka ibe ha zaa ha ụdị ajụjụ ahụ kama ndị dimkpa ịza ha ya.
N’agbanyeghị nke ahụ, o nwere ike isiri gị ezigbo ike gị na ụmụaka ibe gị ikwurịta ihe gbasara okpukpe. N’eziokwu, i kwesịghị imewe ka onye okpukpe ya na-agba ara ma ọ bụkwanụ chewe na i kwesịrị ikwutecha ihe niile. Ịgwa ndị mmadụ ihe i kweere dị ka ịpị ngwá egwú. Ná mmalite, o nwere ike ịra gị ahụ́. Ma ka ị na-amụ ya, ọ ga-adịkwuru gị mfe, mgbalị i mere ga-abara gị ezigbo uru. Otú ọ dị, olee otú ị ga-esi amalite ụdị nkwurịta okwu ahụ?
Ọtụtụ mgbe, i nwere ike iji ihe ndị dị mfe malite. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na e nwere okwu onye ọ bụla kpụ n’ọnụ n’ụlọ akwụkwọ unu, i nwere ike ịgwa ha ihe ị ma Baịbụl kwuru banyere ya. Ma ọ bụkwanụ, i nwere ike ịgwa ya otu nwa klas unu. Ụzọ ọzọ ka mfe Ndị Kraịst na-eto eto sirila mee ya bụ idewe akwụkwọ e ji amụ Baịbụl n’elu oche ha, na-ele ma ò nwere onye ọ ga-amasị. Ọtụtụ mgbe, ọ na-amasị nwa klas ha, nkwurịta okwu amalite!
N’ime ụzọ ndị ahụ e kwuru, olee nke ị ga-achọ ime? ․․․․․
Ò nwere ụzọ ọzọ i chetara ị ga-esi amalite ịgwa nwa klas unu ihe i kweere? Ọ bụrụ na e nwere, dee ya ebe a.
․․․․․
Mgbe ụfọdụ, ihe unu chọrọ ịmụ n’ụlọ akwụkwọ nwere ike ime ka i nwee ohere ịgwa ndị ọzọ ihe i kweere. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na unu amụwa ihe banyere evolushọn, gịnị ka ị ga-eme? Olee otú ị ga-esi akọwa na i kweere na e kere ihe niile eke?
Otú Ị Ga-esi Akọwa na E Kere Ihe Niile Eke
Otu nwa okorobịa aha ya bụ Ryan kwuru, sị: “Mgbe anyị na-amụ banyere evolushọn, ihe a kụziiri anyị dị nnọọ iche n’ihe m mụtara na Baịbụl. Otú e si kụzie ya mere ka o yie eziokwu, meekwa ka m ghara inwe ọnụ okwu.” Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Raquel kwuru ihe yiri ya. O kwuru, sị: “Ezigbo ụjọ tụrụ m mgbe onye na-akụziri anyị ihe ọmụmụ social studies kwuru na n’ụbọchị ọzọ, ihe anyị ga-amụ bụ evolushọn. Ama m na m ga-anọrịrị na klas kọwaa ihe m kweere banyere okwu a na-akpatakarị arụmarụ.”
Olee otú ọ na-adị gị ma onye nkụzi unu malite ịkụzi evolushọn na klas unu? I kweere na ọ bụ Chineke “kere ihe niile.” (Mkpughe 4:11) Ebe ọ bụla i lere anya, ị na-ahụ ihe na-egosi na e ji amamihe kee ihe niile. Ma akwụkwọ unu ji amụ ihe na onye nkụzi unu kwuru na mmadụ si n’enwe pụta. I nwere ike na-eche ma ì rijuola afọ ịrụ “ndị ọkachamara” ụka.
Ka obi sie gị ike na ọ bụghị naanị gị bụ onye na-ekwetaghị n’ozizi evolushọn. N’eziokwu, ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị ekweghị na ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa ọtụtụ ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ.
N’agbanyeghị nke ahụ, ị chọọ ịkọwa na i kweere na e kere ihe niile eke, i kwesịrị ịma ihe Baịbụl na-akụzi n’ezie banyere ya. Ọ baghị uru ka gị na ha rụwa ụka n’ihe Baịbụl na-ekwughị hoo haa. Legodị ihe atụ ndị a.
Akwụkwọ anyị ji amụ sayensị kwuru na ụwa na mbara igwe anọọla ọtụtụ ijeri afọ. Baịbụl kwuru na Chineke ekeela eluigwe na ụwa tupu ụbọchị nke mbụ ọ malitere ike ihe. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na ụwa na mbara igwe anọọla ọtụtụ ijeri afọ.—Jenesis 1:1.
Onye nkụzi anyị kwuru na o nweghị ike ịbụ na e ji ụbọchị isii nkịtị kee ụwa. Baịbụl ekwughị na ụbọchị nke ọ bụla n’ime ụbọchị isii ahụ Chineke ji kee ihe bụ awa iri abụọ na anọ.
Na klas anyị, a gwara anyị ụzọ dị iche iche ụmụ anụmanụ na mmadụ sirila gbanwee. Baịbụl kwuru na Chineke kere ihe ndị dị ndụ “n’ụdị ha dị iche iche.” (Jenesis 1:20, 21) Ọ kwadoghị na ndụ si n’ihe na-adịghị ndụ pụta, ma ọ bụkwanụ na Chineke kere naanị otu mkpụrụ ndụ, mkpụrụ ndụ ahụ amalitezie ịgbanwe, mee ka e nwee ihe niile dị ndụ. N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ike inwe mgbanwe dị iche iche ‘n’ụdị’ nke ọ bụla. N’ihi ya, otú Baịbụl si kwuo okwu gosiri na e nwere ike inwe ụdị dị iche iche n’ime otu ‘ụdị’ ihe e kere eke.
N’ihi ihe e kwuru n’isiokwu a, olee ihe ị ga-agwa onye nkụzi unu ma ọ bụ nwa klas unu ma o kwuo, sị:
“Sayensị egosila na anyị si n’enwe pụta.” ․․․․․
“Ekweghị m na Chineke n’ihi na anaghị m ahụ ya anya.” ․․․․․
Ka Obi Sie Gị Ike n’Ihe I Kweere!
Ọ bụrụ na a mụrụ gị n’ezinụlọ Ndị Kraịst, o nwere ike ịbụ na ihe mere i ji kweta na ọ bụ Chineke kere ihe niile bụ na ọ bụ ihe a kụziiri gị. Ugbu a ị na-eto, i kwesịrị iji ‘ike iche echiche gị’ na-efe Chineke, marakwa ihe mere i ji kwere n’ihe i kweere. (Ndị Rom 12:1) N’ihi ya, jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị mere m ji kweta na e nwere Onye kere ihe niile?’ Otu nwata nwoke dị afọ iri na anọ aha ya bụ Sam chebaara otú ahụ́ mmadụ dị echiche. O kwuru, sị: “Ihe niile zuru ezu ma dị mgbagwoju anya. Akụkụ ahụ́ niile na-arụkọkwa ọrụ ọnụ. O nweghị otú ọ ga-esi bụrụ na ahụ́ mmadụ pụtaara onwe ya n’enweghị onye kere ya!” Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Holly kwetara ihe ahụ Sam kwuru. Ọ sịrị: “Kemgbe m chọpụtara na m na-arịa ọrịa shuga, amụtala m ọtụtụ ihe banyere otú ahụ́ mmadụ si arụ ọrụ. Dị ka ihe atụ, e nwere obere ihe na-adị n’okpuru afọ mmadụ a na-akpọ anyịnya. Otú o si eme ka ọbara na ihe ndị ọzọ dị n’ahụ́ mmadụ na-arụ ọrụ nke ọma dị egwu.”
N’ebe a, dee ihe atọ mere i ji kweta na e nwere Onye kere ihe niile.
1. ․․․․․
2. ․․․․․
3. ․․․․․
I kwesịghị ime ihere n’ihi na i kweere na Chineke nakwa na ọ bụ ya kere ihe niile. N’ihi ihe àmà e nwere, ọ bara uru ikweta na e ji amamihe kee anyị bụ́ ụmụ mmadụ.
A sị ka e nyochawa ya, ọ bụ ozizi evolushọn na-eme ka mmadụ kwere n’ihe na-enweghị isi na ọdụ, ọ bụghị okike. O yiri ikwere n’ọrụ ebube ma ghara ikwe na e nwere onye rụrụ ya! Ọ bụrụhaala na i jiri ike iche echiche gị leba okwu a anya nke ọma, obi ga-esikwu gị ike ịgwa ndị ọzọ ihe mere i ji kwere na Chineke.
Ị na-ahụ ka a na-eme ụmụaka ibe gị baptizim. Ị̀ dịla njikere ka e mee gị baptizim?
AMAOKWU BAỊBỤL
“Ihere ozi ọma ahụ adịghị eme m; n’eziokwu, ọ bụ ike Chineke maka ịzọpụta onye ọ bụla nke nwere okwukwe.” —Ndị Rom 1:16.
NDỤMỌDỤ
Lezie anya n’otú i si eme mgbe ị na-agwa ndị ọzọ ihe i kweere. Ọ bụrụ na ihere na-eme gị, o nwere ike ime ka ụmụaka ibe gị chịwa gị ọchị. Ma i kwuo okwu ka onye ihe doro anya—otú ahụ ụmụ klas unu na-eme ma ha kwuwe ihe ha chere—i nwere ike ime ka ha na-akwanyere gị ùgwù.
Ị̀ MA NA . . . ?
Mgbe ụfọdụ a gwara ndị nkụzi ka ha kwuo ihe mere ha ji kwere n’ozizi evolushọn, ha na-achọpụta na ha anaghị ekwuli ya. Ha na-achọpụtakwa na ihe mere ha ji kwere na ya bụ na ọ bụ ihe a kụziiri ha.
IHE M GA-EME!
Ka m nwee ike ime ka mụ na nwa klas anyị kwurịta ihe dị na Baịbụl, ihe m ga-eme bụ ․․․․․
Ọ bụrụ na a jụọ m ihe mere m ji kwere na e nwere Onye kere ihe niile, ihe m ga-ekwu bụ ․․․․․
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․
GỊNỊ KA I CHERE?
● Gịnị mere o ji dị mkpa ka ị gwa ndị ọzọ ihe i kweere?
● N’ụlọ akwụkwọ unu, olee ụzọ ụfọdụ ga-adịrị gị mfe ị ga-esi kọwaa ihe mere i ji kwere na e kere ihe niile eke?
● Olee otú ị ga-esi egosi na ị na-ekele Onye kere ihe niile?—Ọrụ 17:26, 27.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 299]
“Ụlọ akwụkwọ bụ ókèala anyị ebe naanị anyị nwere ike izi ozi ọma.”—Iraida
[Foto dị na peeji nke 298]
Ịgwa ndị ọzọ banyere ihe i kweere dị ka ịpị ngwá egwú. A na-eji nkà eme ha abụọ—ka ị na-eme ya mgbe niile, ọ ga na-edokwu gị anya
[Foto dị na peeji nke 300 na 301]
Ọ bụrụ na ụjọ na-atụ gị ịgwa ndị ọzọ ihe i kweere, i nwere ike imeri ya
-