ISI NKE 30
M̀ Kwesịrị Igwu Egwuregwu Kọmputa?
OTU nwata nwoke aha ya bụ Brian kwuru, sị: “Egwuregwu kọmputa na-atọ ụtọ, ọ bụkwa ebe a nọ. Mgbe ị na-egwu ya, ị ga-emeli ihe ọ ga-abụ i mee n’ìhè, gị abanye n’ezigbo nsogbu.” Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Deborah kwukwara na igwu egwuregwu kọmputa na-atọ ya ụtọ. Otú ọ dị, ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọ na-eri mmadụ oge, o nwekwara ike iri mmadụ ahụ́.”
O doro anya na egwuregwu kọmputa abụghị naanị ntụrụndụ ọgbara ọhụrụ. N’eziokwu, ọ ga-egosi ma ì nwere nkà, nyekwara gị aka chụọ ike ọgwụgwụ. Ma, ọ na-eme ihe karịrị nke ahụ. Egwuregwu kọmputa nwekwara ike ime ka ụbụrụ gị na-aghọ nkọ. Ụfọdụ n’ime ha nwedịrị ike ime ka ị mụtakwuo ịrụ mgbakọ na mwepụ, nakwa otú e si agụ ihe nke ọma. Ọzọkwa, egwuregwu kọmputa pụtara ọhụrụ nwere ike ịbụ okwu ụmụ akwụkwọ ibe gị kpụ n’ọnụ. Ọ bụrụ na i gwuola ya, ị ga-enwe ihe ị ga-akọrọ ha.
N’ezie, ọ bụrụ na ị saa anya ná mmiri chọọ, ị ga-achọta nke dị ụtọ Onye Kraịst nwere ike igwu. Ma gịnị mere ị ga-eji asa anya ná mmiri?
Nsogbu Ya
Ọ dị mwute na ọ bụghị egwuregwu kọmputa niile dị mma. Ọtụtụ n’ime ha taa na-akwadosi ihe Baịbụl kpọrọ “ọrụ nke anụ ahụ́” ike, ya bụ, omume rụrụ arụ Chineke kpọrọ asị.—Ndị Galeshia 5:19-21.
Otu nwa okorobịa dị afọ iri na asatọ aha ya bụ Adrian kwuru na otu egwuregwu kọmputa na-ewu ewu na-egosi “ịlụ agha, ịṅụ ọgwụ ike, inwe mmekọahụ, okwu rụrụ arụ, ime ihe ike, ịwụfu ọbara, na ihe ọjọọ ndị ọzọ.” Ụfọdụ n’ime ha na-akwadokwa anwansi. Nke ọhụrụ ọ bụla e wepụtara na-akakwa ndị bu ya ụzọ njọ. Mmadụ na mmadụ nwere ike igwu ọtụtụ n’ime ha n’Ịntanet. O meela ka igwu egwuregwu kọmputa na-atọkwu ụtọ. Otu nwa okorobịa dị afọ iri na itoolu aha ya bụ James kwuru, sị: “I nwere ike iji kọmputa dị n’ụlọ gị gị na ndị nọ ná mba ndị ọzọ asọọ mpi.”
Ihe na-ewu ugbu a bụ egwuregwu kọmputa ndị a na-enwe n’Ịntanet, ebe ndị na-egwu ha ga na-eme ka hà bụ ndị nọ n’egwuregwu ndị ahụ. N’ụdị ndị a, ndị na-egwu ha na-eji aka ha ewepụta ndị ha ga-eji egwu nke ha chọrọ igwu. O nwere ike ịbụ mmadụ, anụmanụ, ma ọ bụkwanụ ha abụọ. Ha na-emepụta ebe yiri ụwa n’ime kọmputa, bụ́ ebe e nwere ọtụtụ puku ihe ndị ọzọ yiri anụmanụ ma ọ bụ mmadụ. N’ebe ahụ, a na-enwe ụlọ ahịa, ụgbọala, ụlọ, ebe a na-agba egwú, ụlọ ndị akwụna, ya bụ, ọ na-adị nnọọ ka ụwa anyị a. Ndị na-egwu egwuregwu a nwere ike iji kọmputa na-ezirịta ozi mgbe ndị ahụ ha ji kọmputa wepụta na-asọ mpi.
Ụfọdụ n’ime ndị ọjọọ a na-ahụ n’egwuregwu a bụ ndị òtù ọjọọ, ndị akwụna na ndị na-akpọtara ha ndị ahịa, ndị ohi, ndị na-emepụta ihe adịgboroja, na ndị na-egbu mmadụ. Ndị na-egwu egwuregwu a nwere ike ime ihe ha na-agaghị emeli n’ìhè. Ha nwekwara ike ịpị bọtịn aka, mee ka ndị ahụ ha wepụtara na kọmputa malite inwe mmekọahụ, ha onwe ha ejiri kọmputa na-ezirịta ozi banyere mmekọahụ. N’egwuregwu kọmputa ụfọdụ, ndị ahụ ha wepụtara na ndị ọzọ yiri ụmụaka nwere ike inwe mmekọahụ. O doro anya na ọ na-ewute ndị na-akatọ egwuregwu ahụ na ndị mmadụ na-eji ụdị omume rụrụ arụ ahụ egwu egwuregwu.
Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ka Ị Họrọ nke Dị Mma
Ndị na-egwu ụdị egwuregwu ahụ a na-eme ihe ike ma ọ bụ na-enwe mmekọahụ na ya nwere ike ikwu, sị: “O nweghị onye e merụrụ ahụ́. Ihe ahụ emeghị eme. Ọ bụ naanị egwuregwu.” Ma ekwela ka e jiri ụdị ụgha ahụ rafuo gị!
Baịbụl kwuru, sị: “Nwatakịrị na-esi n’omume ya eme ka a mata onye ọ bụ, ma ihe ọ na-eme ọ̀ dị ọcha, ziekwa ezi.” (Ilu 20:11) Ọ bụrụ na ị na-egwu egwuregwu ndị a na-eme ihe ike ma ọ bụ omume rụrụ arụ na ha, à ga-akpọ gị onye omume ya dị ọcha, na onye ziri ezi? Nchọpụta ndị e mere gosiri na mmadụ ikiri egwuregwu a na-eme ihe ike na ya na-eme ka onye ahụ na-eme ihe iwe iwe. N’eziokwu, ụfọdụ ndị ọkachamara kwuru na ebe ọ bụ na ndị na-egwu egwuregwu kọmputa na-eso eme ihe a na-eme na ya, o nwere ike imetụta mmadụ karịa ihe a na-egosi na TV.
Mmadụ ịhọrọ igwu egwuregwu kọmputa ndị a na-eme ihe ike ma ọ bụ omume rụrụ arụ na ha yiri iji ihe na-esi ísì ọjọọ na-egwuri egwu—o nwere ike ọ gaghị ama na ọ na-emebi ya ahụ́, ma ọ ga-emebirịrị ya ahụ́. Olee otú ọ ga-esi emebi ya ahụ́? Ikuru ísìsì ọjọọ ahụ mgbe niile nwere ike imebi akpa ume mmadụ ma kpatara onye ahụ ọrịa. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ị na-egwu egwuregwu kọmputa ndị a na-enwe mmekọahụ ma ọ bụ na-eme ihe ike na ha, ọ ga-eme ka ‘mmehie ghara iwute’ gị, meekwa ka ọchịchọ anụ ahụ́ na-achị echiche gị na omume gị.—Ndị Efesọs 4:19; Ndị Galeshia 6:7, 8.
Olee Egwuregwu Kọmputa M Kwesịrị Ịhọrọ?
Ọ bụrụ na papa gị na mama gị kwere ka ị na-egwu egwuregwu kọmputa, olee otú ị ga-esi ama nke i kwesịrị ịhọrọ nakwa awa ole ị ga-eji na-egwu ya? Jụọ onwe gị ajụjụ ndị a:
Olee otú nke m họọrọ ga-esi emetụta otú Jehova si ele m anya? Abụ Ọma 11:5 kwuru, sị: “Jehova na-enyocha ma onye ezi omume ma onye ajọ omume, mkpụrụ obi ya kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.” Okwu Chineke kwukwara banyere ndị na-eme anwansi, sị: “Onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ ihe arụ n’anya Jehova.” (Diuterọnọmi 18:10-12) Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ enyi Chineke, i kwesịrị ime ihe e kwuru n’Abụ Ọma 97:10, bụ́ ebe sịrị: ‘Kpọọ ihe ọjọọ asị.’
Olee otú ọ ga-esi emetụta echiche m? Jụọ onwe gị, sị, ‘Igwu egwuregwu a ọ̀ ga-eme ka ọ dịkwuoro m mfe ‘ịgbara ịkwa iko ọsọ’ ka ọ̀ ga-eme ka o sikwuoro m ike?’ (1 Ndị Kọrịnt 6:18) Egwuregwu kọmputa ndị na-egosi ihe na-akpali agụụ mmekọahụ, ma ọ bụ ndị a na-ekwu ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na ha agaghị eme ka ị na-eche ihe ziri ezi, ihe dị ọcha nakwa ihe a na-ekwu okwu ọma banyere ya.—Ndị Filipaị 4:8.
Awa ole ka m ga-eji na-egwu ya? Egwuregwu kọmputa ndị na-adịghị njọ nwedịrị ike iri ezigbo oge. N’ihi ya, na-edekọ awa ole i ji na-egwu ya edekọ. Ọ̀ na-eri oge i kwesịrị iji eme ihe ndị ka mkpa? Ọ bụrụ na ị na-edekọ awa ole i ji egwu egwuregwu ahụ, ọ ga-enyere gị aka iji oge gị na-eme ihe ndị ka mkpa.—Ndị Efesọs 5:16.
N’eziokwu, Baịbụl ekwughị na naanị ihe ị ga-eji oge gị niile na-eme bụ ịmụ ihe na ịrụ ọrụ dị n’ụlọ. Kama nke ahụ, ọ na-echetara anyị niile na e nwere “oge ịchị ọchị . . . na oge ịwụli elu.” (Ekliziastis 3:4) Ma, buru n’obi na okwu ahụ bụ́ “ịwụli elu” apụtaghị naanị igwuri egwu, kama ọ pụtakwara imega ahụ́. N’ihi ya, ọ́ gaghị aka mma ka i jiri oge gị ụfọdụ na-emega ahụ́ kama ịnọ na-apị kọmputa ma ọ bụ TV mgbe niile?
Jiri Amamihe Na-ahọrọ nke Ị Ga-egwu
O doro anya na igwu egwuregwu kọmputa na-atọ ụtọ, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ị ma ya egwu. Ọ bụ ya mere i kwesịrị iji jiri amamihe na-ahọrọ nke ị ga-egwu. Jụọ onwe gị, sị, ‘N’ime ihe ndị m na-amụ n’ụlọ akwụkwọ, olee ndị m kacha eme nke ọma na ha?’ Ọ́ bụghị ha na-akacha atọ gị ụtọ? N’eziokwu, ka ihe ị na-amụ na-atọ gị ụtọ, otú ahụ ka ọ na-edokwu gị anya. Ugbu a, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee egwuregwu kọmputa na-akacha atọ m ụtọ? Olee ihe ọma ọ na-akụziri m?’
Kama igwu egwuregwu kọmputa n’ihi na ọ na-amasị ndị ọgbọ gị, kata obi kpebie ụdị ndị ị ga-egwu dabere n’ihe ị maara. Nke ka nke, mee ihe a Baịbụl dụrụ ọdụ ya: “Na-achọpụtanụ ihe dị Onyenwe anyị mma.”—Ndị Efesọs 5:10.
Ka e were ya na egwú na-atọ gị ụtọ, ọ dịghịkwa njọ. Ma, ò riela gị isi?
AMAOKWU BAỊBỤL
“Unu ndị hụrụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị.”—Abụ Ọma 97:10.
NDỤMỌDỤ
Dee ná nkenke banyere egwuregwu kọmputa ọ bụla ị chọrọ igwu, kọwaa ihe mere e ji egwu ya na otú e si egwu ya. Jiri ihe i dere tụnyere ụkpụrụ Baịbụl a kọwara n’isiokwu a, marazie ma ì kwesịrị igwu egwuregwu ahụ.
Ị̀ MA NA . . . ?
N’afọ 2006, n’obodo Amsterdam nke dị na Netherlands, e mepere ụlọ ọgwụ mbụ n’ụwa nke na-agwọ ndị egwuregwu kọmputa riri isi.
IHE M GA-EME!
Ọ bụrụ na enyi m agwa m ka m gwuo egwuregwu kọmputa a na-eme ihe ike na omume rụrụ arụ na ya, ihe m ga-agwa ya bụ ․․․․․
Naanị awa ole m ga-eji na-egwu egwuregwu kọmputa n’izu bụ ․․․․․, ihe ga-enyere m aka ime ya bụ ․․․․․
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․
GỊNỊ KA I CHERE?
● Olee otú egwuregwu kọmputa ga-esi emetụta echiche mmadụ na àgwà ya?
● Gịnị mere o ji dị mkpa ka i chebara ụkpụrụ Jehova echiche mgbe ị na-ahọrọ egwuregwu kọmputa ị ga-egwu?
● Olee otú ị ga-esi enyere nwanne gị ị tọrọ aka ma ọ bụrụ na egwuregwu kọmputa ị ma na ọ dịghị mma eriela ya isi?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 249]
“Ọtụtụ egwuregwu kọmputa na-eme ka ime ihe ike, ikwu okwu rụrụ arụ, na ime omume rụrụ arụ ghara ịdị gị ka ihe ọjọọ. O nwekwara ike ime ka i mee ihe ọjọọ ndị ọzọ. I kwesịrị ịkpachara anya n’ụdị egwuregwu kọmputa ndị ị na-egwu.”—Amy
[Foto dị na peeji nke 250]
Mmadụ igwu egwuregwu kọmputa ndị a na-eme ihe ike ma ọ bụ omume rụrụ arụ na ha yiri iji ihe na-esi ísì ọjọọ na-egwuri egwu—o nwere ike ọ gaghị ama na ọ na-emebi ya ahụ́, ma ọ ga-emebirịrị ya ahụ́