Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Nsogbu nke Na-echu Onye Ọ Bụla Bụ́ Nne Ma Ọ Bụ Nna Ụra
    Teta!—2007 | Ọktoba
    • Nsogbu nke Na-echu Onye Ọ Bụla Bụ́ Nne Ma Ọ Bụ Nna Ụra

      SCOTT na Heather bụ di na nwunye obi ụtọ, ndị ahụ́ dị gara gara. Ha mụtakwara nwa nwoke ahụ́ gbasiri ike, nke dị afọ atọ, nke ụbụrụ na-aghọ nkọ.a Ha na-elekọta nwa ha nwoke nke ọma. N’ụwa taa, ilekọta nwatakịrị nke ọma abụghị obere ọrụ. Ọ na-akpata oké nchegbu. Ọrụ dị na ya karịkwara akarị. E nwere ọtụtụ ihe e kwesịrị ịkụziri ụmụaka. Otu n’ime ibu ọrụ kacha echu Scott na Heather ụra bụ nke a: Ha chọrọ ichebe nwa ha ka a ghara imetọ ya. N’ihi gịnị?

      Heather kwuru, sị, “Papa m bụ onye aṅụrụma ihu na-adịghị atọ ọchị. Ọ na-ewekarịkwa iwe. Ọ na-akụ m isi aba okpu. O metọkwara mụ na ụmụnne m ndị nwanyị.”b Ọtụtụ mmadụ kwetara na ụdị mmetọ a na-enye onye e metọrọ nsogbu n’obi nke ukwuu. Ka a sịkwa ihe mere Heather ji kpebisie ike ichebe nwa ya nwoke! Scott chekwara na ọ dị mkpa ka ha chebe nwa ha.

      Ọtụtụ ndị nne na nna na-echegbu onwe ha banyere mmetọ a na-emetọ ụmụaka. Ikekwe, ị na-echegbukwa onwe gị banyere ya. O nwere ike ịbụ na e metọbeghị gị dị ka e metọrọ Scott na Heather. O nwekwara ike ịbụ na ị maghị otú ọ na-adị. Ma o doro anya na ị nụtụla akụkọ ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ́ banyere otú omume ọjọọ a si ju ebe nile. N’ụwa nile, obi na-amapụ ezigbo ndị nne na nna ma ha nụ ihe ndị a na-eme ụmụaka bi n’ógbè ha.

      Ọ bụghị ihe ijuanya na otu onye na-eme nnyocha n’ihe banyere imetọ mmadụ kọwara otú imetọ ụmụaka si arị elu dị ka “otu n’ime ihe a chọpụtarala kasị akụda mmụọ n’oge anyị a.” Nke a bụ nnọọ akụkọ ọjọọ. Ma ọ̀ bụ ihe ijuanya na ndị mmadụ na-eme omume ọjọọ ndị a? Ọ naghị eju ndị na-amụ Bible anya. Okwu Chineke kọwara na anyị bi n’oge nsogbu, nke a na-akpọ ‘ụbọchị ikpeazụ.’ Ọ bụkwa oge ndị mmadụ ga “na-eme ihe ike ike,” oge ha ‘ga-ahụ nanị onwe ha n’anya,’ gharakwa inwe “obi mmadụ.”—2 Timoti 3:1-5.

      Imetọ mmadụ bụ nsogbu a na-amaghị ihe a ga-eme ya eme. N’ezie, ọ na-eri ụfọdụ ndị nne na nna ọnụ ma ha cheta otú obi si fee ndị mmadụ azụ, bụ́ ndị na-achọgharị ụmụaka ha ga-emetọ. Ma, nsogbu a ọ̀ karịrị ndị mụrụ ụmụ nke na o nweghị ihe ha ga-emeli banyere ya? Ka è nwere ezigbo ihe ndị nne na nna nwere ike ime iji chebe ụmụ ha ka ihe ọ bụla ghara ime ha? Isiokwu ndị na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.

      [Ihe odide ala ala peeji]

      a A gbanwere aha ndị e kwuru okwu ha n’isiokwu a nakwa n’isiokwu abụọ ndị na-eso ya.

      b Imetọ nwatakịrị pụtara onye toro eto iji nwatakịrị na-egbo agụụ mmekọahụ na-agụ ya. Nke a na-agụnyekarị ihe Bible kpọrọ ịkwa iko, ma ọ bụ por·neiʹa. Omume ndị so na nke a bụ ịpị nwoke aka n’amụ ma ọ bụ imetụ nwanyị aka n’ọtụ, idina mmadụ, iji ọnụ amịcha amụ ma ọ bụ ọtụ, na isi n’ikè enwe mmekọahụ. Omume mmetọ ndị ọzọ, ndị dị ka ịpị nwanyị aka n’ara, mmadụ ịgwa onye ọzọ ka ya na ya nwee mmekọahụ n’ezoghị ọnụ, igosi nwatakịrị foto ma ọ bụ fim ndị gba ọtọ, ikiri ndị na-enwe mmekọahụ, na mmadụ ịma ụma gbara ọtọ n’ebe ọ na-ekwesịghị ịgba ọtọ, nwere ike iso n’ihe ndị Bible katọrọ ma kwuo na ha bụ “omume rụrụ arụ” ma ọ bụ “ụdị anyaukwu . . . na-arụpụta adịghị ọcha.”—Ndị Galeshia 5:19-21; Ndị Efesọs 4:19.

  • Otú Ị Ga-esi Chebe Ụmụ Gị
    Teta!—2007 | Ọktoba
    • Otú Ị Ga-esi Chebe Ụmụ Gị

      Ọ BỤ nanị mmadụ ole na ole n’ime anyị ga-achọ ichewe echiche ogologo oge banyere mmetọ a na-emetọ ụmụaka. Nanị ichetụdị ya n’echiche na-amapụ ndị nne na nna obi! N’agbanyeghị nke a, ụdị mmetọ a nke na-emenye ndị mmadụ ụjọ, nke dịkwa mwute na-eme eme n’ụwa taa. Ọ na-akpakwa ụmụaka aka ọjọọ. Ma, è kwesịdịrị itinye ọnụ n’okwu a? Olee ihe ị ga-adị njikere ime ka ihe ọ bụla ghara ime nwa gị? Nanị ịmata na e nwere ndị na-emetọ ụmụaka nwere ike iyi ihe ọ na-enweghị ihe ọ bụ. Ma, o nwere ike inye aka ichebe ụmụ gị.

      Ekwela ka mmetọ a juru ebe nile kụda gị aka. Ma ọ́ dịghị nnọọ ihe ọzọ, i nwere ike nke nwa gị na-enweghị—ụdị ike nke ga-ewe nwa gị ọtụtụ afọ, ọbụna ọtụtụ iri afọ, tupu ya enweta ya. Ọtụtụ afọ i birila ndụ emeela ka ị mara ọtụtụ ihe, meekwa ka i nwee ọtụtụ ahụmahụ na amamihe. Isi ihe dị na ya bụ ịgbakwu mbọ jiri ihe ndị a i nwere na-echebe nwa gị. Anyị ga-atụle ihe atọ bụ́ isi nne na nna ọ bụla nwere ike ime. Ha bụ: (1) Bụrụ onye mbụ ga-echebe nwa gị ka a ghara imetọ ya, (2) kọọrọ nwa gị ihe ndị o kwesịrị ịma banyere mmekọahụ, nakwa (3) kụziere nwa gị ihe ndị bụ́ isi ọ ga-eme iji chebe onwe ya.

      Ị̀ Bụ Onye Mbụ Na-echebe Nwa Gị Ka A Ghara Imetọ Ya?

      Ndị ọ bụ ọrụ ha ichebe ụmụaka ka a ghara imetọ ha bụ ndị nne na nna, ọ bụghị ụmụaka. Ya mere, ọ dị mkpa ibu ụzọ kụziere ndị nne na nna ihe tupu a kụziwere ụmụaka. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, o nwere ihe ole na ole ọ dị mkpa ka ị mata banyere mmetọ a na-emetọ ụmụaka. Ọ dị mkpa ka ị mata ụdị ndị na-emetọ ụmụaka na otú ha si eme ya. Ndị nne na nna na-echekarị na ndị na-emetọ ụmụaka bụ ndị ha na-amaghị ama, bụ́ ndị na-abịa mgbe ọchịchịrị gbara, na-achọ otú ha ga-esi tọrọ ụmụaka ma dinaa ha n’ike. N’eziokwu, e nwere ndị si otú ahụ eme ya. Ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-eme ka anyị mara banyere ndị a mgbe nile. Ma, ndị si otú ahụ eme ya dị nnọọ ole na ole. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na mgbe ọ bụla e metọrọ nwatakịrị, onye rụrụ arụrụala ahụ bụ onye nwatakịrị ahụ ma ama ma tụkwasị obi.

      Ọ na-esi nnọọ ike ikweta na o nwere ike ịbụ onye agbata obi gị nke ihe na-adabara gị na ya, onye nkụzi, nọọsụ ma ọ bụ dọkịta, onye na-akụzi egwuregwu, ma ọ bụ onye ikwu, ga-achọ imetọ nwa gị. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ mmadụ adịghị otú ahụ. Ọ dịghị mkpa ibido nyowe mmadụ nile gị na ha na-emekọ ihe enyowe. Ma, i nwere ike ichebe nwa gị site n’ịmụta ụzọ aghụghọ onye na-emetọ ụmụaka si abịa.—Lee igbe dị na peeji nke isii.

      Ịmata ụzọ aghụghọ ndị ahụ nwere ike ime ka gị onwe gị bụ́ nne ma ọ bụ nna dịkwuo njikere ịbụ onye mbụ ga-echebe nwa gị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na otu onye nke na-enwekarị mmasị n’ebe ụmụaka nọ karịa ka ọ na-enwe n’ebe ndị toro eto nọ enwee mmasị n’ebe nwa gị nọ ma na-emeso ya ihe n’ụzọ pụrụ iche, na-enye ya onyinye ma ọ bụ kwuo ka o legidere gị nwa gị ahụ anya mgbe ị na-agaghị anọ, ma ọ bụkwanụ kwuo ka nanị ya na nwa gị soro kpapụ, gịnị ka ị ga-eme? Ị̀ ga-ekwubi ozugbo na onye ahụ bụ onye na-emetọ ụmụaka? Mbanụ. Ekwubila otú ahụ ozugbo. O nwere ike ịbụ na onye mere otú ahụ ebughị ihe ọjọọ ọ bụla n’obi. Ma, nke a nwere ike ime ka i lerukwuo anya ala. Bible sịrị: “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.”—Ilu 14:15.

      Cheta na onye na-ekwe gị nkwa imere gị elu na ala nwere ike ịdị na-ekwe nkwa ahụ iji ghọgbuo gị. Jiri nlezianya nyochaa onye ọ bụla gwara gị ka nanị ya na nwa gị nọrọ. Mee ka onye ahụ mara na i nwere ike ịbịa leta nwa gị oge ọ bụla ị chọrọ. Melissa na Brad, bụ́ di na nwunye nwere ụmụntakịrị nwoke atọ, na-akpachapụ anya banyere otú ha si ahapụrụ ndị toro eto ụmụ ha. Otu oge, mgbe a na-akụziri otu n’ime ụmụ Melissa egwu n’ụlọ ha, ọ gwara onye na-akụziri nwa ya egwu, sị: “M ga na-abata n’ime ụlọ a mgbe ọ bụla m chọrọ ruo mgbe ị lara.” O nwere ike iyi ka nke a ọ̀ gafeela ókè, ma ọ kaara ndị nne na nna mma ime otú ahụ karịa ịkwa m̀ makwaara n’ikpeazụ.

      Ka uche gị dịrị n’ihe nile nwa gị na-eme. Mata ndị bụ́ ndị enyi ya, nakwa ihe ọ na-eme n’ụlọ akwụkwọ. Mata ihe nile banyere mkpapụ nwa gị chọrọ ime. Otu dọkịta nke na-agwọ ndị isi na-akpakọchaghị ọnụ, bụ́ onye nyeerela ndị e metọrọ aka ruo afọ iri atọ na atọ, kwuru na ya ahụla ọtụtụ mmetọ a gaara egbochi ma a sị nnọọ na ndị mụrụ ụmụ leruru anya ala. Ọ sịrị na otu onye nke metọrọ ụmụaka, bụ́ onye a mara ikpe, kwuru, sị: “Ọ bụ ndị nne na nna na-eji aka ha akpọnye anyị ụmụ ha. . . . Ha mere nnọọ ka ọ dịrị m mfe.” Chetakwa na ọtụtụ ndị na-emetọ ụmụaka na-achọ ụmụaka ndị na-agaghị esiri ha ike inweta. Ndị nne na nna, bụ́ ndị na-etinyesi anya ike n’ebe ụmụ ha nọ, na-eme ka o siere ndị na-emetọ ụmụaka ike inweta ha.

      Otú ọzọ i nwere ike isi bụrụ onye mbụ ga-echebe nwa gị ka a ghara imetọ ya bụ site n’ige ya ntị nke ọma. Ụmụaka anaghị ekwukarị hoo haa na e metọọla ha; ọ na-eme ha ihere, ụjọ na-atụkwa ha n’ihi na ha amaghị ihe ndị mmadụ ga-eme ma ha nụ ya. Ya mere, na-ege ha ntị nke ọma iji nụta ụmụ obere ihe ndị ga-eme ka ị mara ihe na-emenụ.a Ọ bụrụ na o nwere ihe nwa gị kwuru nke na-enye gị nsogbu n’obi, jiri nwayọọ were ajụjụ jụpụta ya ihe dị ya n’obi. Ọ bụrụ na ọ sịrị na ọ chọghịzi ka otu onye nke na-elekọtabu ya na-elekọta ya, jụọ ya ihe mere o ji kwuo otú ahụ. Ọ bụrụ na ọ sị na o nwere otú otu onye toro eto si egwusa ya egwu, jụọ ya, sị: “Olee ụdị egwu ọ na-egwusa gị? Gịnị ka ọ na-eme gị?” Ọ bụrụ na ọ sịrị na o nwere onye metụrụ ya aka n’ebe na-eme ka ọchị tọwa ya, jụọ ya, sị, “Olee ebe o metụrụ gị aka?” Elegharala ihe nwa ahụ gwara gị anya ozugbo. Ndị na-emetọ ụmụaka na-agwa ha na ọ bụrụ na ha kọọrọ ndị mmadụ, na o nweghị onye ga-ekweta ihe ha kwuru; ihe ahụ ha kwuru na-abụkarịkwa eziokwu. Ọ bụrụ na e metọrọ nwatakịrị, otu ihe nke ga-eme ka o nwetaghachi onwe ya bụ ma nne ya ma ọ bụ nna ya kweta ihe o kwuru ma nyere ya aka.

      Kọọrọ Nwa Gị Ihe Ndị O Kwesịrị Ịma Banyere Mmekọahụ

      Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha nke na-ekwu banyere imetọ ụmụaka sịrị na otu onye nke metọrọ ụmụaka, bụ́ onye a mara ikpe, kwuru, sị: “Ị kpọnye m nwa na-enweghị ihe ọ maara banyere mmekọahụ, mara na ị kpọnyela m onye ọzọ m ga-emetọ.” Ndị nne na nna kwesịrị iburu okwu a nke na-awụ akpata oyi n’ahụ́ n’uche mgbe nile. Ọ na-adịrị nnọọ onye na-emetọ ụmụaka mfe ịghọgbu ụmụaka ndị na-amaghị ihe ọ bụla banyere mmekọahụ. Bible sịrị na ihe ọmụma na amamihe nwere ike ịnapụta anyị “n’aka mmadụ na-ekwu okwu ịgbakụta Chineke azụ.” (Ilu 2:10-12) Ọ̀ bụ na ị chọghị ka a napụta nwa gị n’aka ụdị mmadụ ahụ? Ya bụrụ otú ahụ, ihe nke abụọ bụ́ isi i kwesịrị ime iji chebe ya bụ nke a: ahapụkwala ịkụziri ya banyere mmekọahụ.

      Ma, oleekwanụ otú ị ga-esi mee nke a? Ọ na-eme ọtụtụ ndị nne na nna ihere ịkọrọ ụmụ ha banyere mmekọahụ. Nwa gị nwekwara ike ile ya anya dị ka okwu na-eme ihere karịa. Ọ ga-esitụkwara ya ike ikwulite ihe ọ bụla banyere ya n’ihu gị. Ya mere, kwulite ya n’onwe gị. Melissa kwuru, sị: “Anyị malitere ya n’oge. Anyị malitere site n’ịgwa ha aha akụkụ ahụ́ dị iche iche. Iji gosi ha na e nweghị akụkụ ahụ́ ha na-atọ ọchị, nakwa na e nweghị nke a na-emere ihere, anyị na-agwa ha ihe bụ́ ezigbo aha akụkụ ahụ́ nile, ọ bụghị ihe ụmụaka na-akpọ ya.” Mgbe a gwasịrị ha nke a, ọ na-adịziri ndị nne na nna mfe ịkọrọ ha banyere mmetọ a na-emetọ ụmụaka. Ihe ọtụtụ ndị nne na nna na-eme bụ nanị ịgwa ụmụ ha na akụkụ ahụ́ nke ha na-eyichi drọọsụ bụ akụkụ ahụ́ ha nke pụrụ iche.

      Heather, bụ́ onye e kwuru okwu ya n’isiokwu bu ụzọ, sịrị: “Mụ na Scott gwara nwa anyị nwoke na amụ ya bụ akụkụ ahụ́ pụrụ iche, nke dịịrị nanị ya onwe ya, nakwa na ọ bụghị ihe e ji egwuri egwu. Onye ọ bụla ekwesịghị iji ya gwurie egwu—ma mama ya, ma papa ya, ma dọkịta. Ọ bụrụ na anyị akpọrọ ya gaa na nke dọkịta, anyị na-agwa ya na ihe mere dọkịta ahụ nwere ike iji metụ ya aka n’amụ bụ nanị iji lee ya ahụ́.” Scott na Heather na-agwa nwa ha okwu a n’otu n’otu site n’oge ruo n’oge. Ha na-agwakwa ya ka ọ bịa kọọrọ ha ma onye ọ bụla metụ ya aka n’ahụ́ n’ebe na-adịghị ya mma, ma ọ bụ metụ ya aka otú mere ka ahụ́ ghara iru ya ala. Ndị ọkachamara n’ilekọta ụmụaka na n’igbochi imetọ ụmụaka tụrụ aro ka ndị nne na nna nile na ụmụ ha na-enwe ụdị nkwurịta okwu a.

      Ọtụtụ ndị achọpụtala na akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụb na-enye nnọọ aka ịkụziri ụmụaka banyere mmekọahụ. Isiokwu ya nke iri atọ na abụọ, nke bụ́, “Otú E Si Chebe Jizọs,” kwuru banyere nsogbu imetọ ụmụaka. Ihe o kwuru doro anya, na-emekwa ka obi ruo ụmụaka ala. O kwukwara banyere mkpa ọ dị ụmụaka ichebe onwe ha. Melissa kwuru, sị, “Akwụkwọ a akụzierela anyị ụzọ kacha mma anyị ga-esi mee ka ihe ndị anyị gwara nwa anyị bamikwuo ya n’isi.”

      N’ụwa taa, ọ dị mkpa ka ụmụaka mata na e nwere ndị chọrọ ịdị na-emetụ ụmụaka aka n’ụzọ na-adịghị mma, ma ọ bụkwanụ chọọ ka ụmụaka na-emetụ ha aka n’ụzọ na-adịghị mma. E kwesịghị ịgwa ụmụaka banyere nke a otú ga-emenye ha ụjọ, ma ọ bụ mee ka ha nyowe ndị nile toro eto enyowe. Heather kwuru, sị, “Ihe ị ga-agwa ha ga-eme ka ha mara na ha kwesịrị ichebe onwe ha ka a ghara imetọ ha. Ọ dịghị ihe dị iche n’ihe a ị ga-agwa ha na ọtụtụ ihe ndị ọzọ ị na-agwa ha bụ́ ndị na-agbasaghị mmetọ a na-emetọ ụmụaka. O menyetụdịghị nwa m nwoke ụjọ.”

      Ihe ọzọ i kwesịrị ịkụziri nwa gị bụ na ọ bụghị ihe nile mmadụ gwara ya ka ọ ga-eme. Ịkụziri nwata ka ọ na-erube isi bụ otu ihe dị ezigbo mkpa. Ma, ọ naghị adị mfe. (Ndị Kọlọsi 3:20) O nwere otú ị ga-esi kụzie ya, ya emebie ihe. Ọ bụrụ na a kụziere nwatakịrị na ọ ga na-erubere onye ọ bụla tọrọ ya isi mgbe nile n’agbanyeghị ihe onye ahụ sịrị ya mee, mara na ọ ga-adị mfe imetọ nwa ahụ. Ọ naghị esiri ndị na-emetọ ụmụaka ike ịchọpụta nwatakịrị na-eme ihe ọ bụla a gwara ya mee. Ndị nne na nna ndị maara ihe na-akụziri ụmụ ha na ọ bụghị ihe nile a gwara ha mee ka ha ga-eme. Ọ gaghị esichara Ndị Kraịst ike ịkụziri ụmụ ha nke a. Nanị ihe ha ga-eme bụ ịgwa ha, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla agwa gị ka i mee ihe Jehova bụ́ Chineke kwuru na ọ dị njọ, emela ya. Ọ bụrụgodị na papa gị ma ọ bụ mama gị gwara gị mee ihe Jehova sịrị na ọ dị njọ, emela ya. Oge ọ bụla mmadụ gwara gị mee ihe ọjọọ, bịa kọọrọ ya papa gị ma ọ bụ mama gị.”

      N’ikpeazụ, gwa nwa gị ka ọ ghara ikwe ka onye ọ bụla gwa ya ka ọ na-ezochiri gị ihe. Gwa ya ka ọ bịa kọọrọ gị ma ọ bụrụ na onye ọ bụla agwa ya ka o zochiere gị ihe ọ bụla. N’agbanyeghị ihe a gwara ya—ọ bụrụgodị na onye ahụ asị na ọ ga-emesi ya ike, ma ọ bụ ya abụrụ na o nwere ihe ọjọọ o mere—ọ dị mma mgbe nile ka ọ bịa kọọrọ papa ma ọ bụ mama ihe nile. Agwala nwa gị ihe a otú ọ ga-emenye ya ụjọ. I nwere ike imesi ya obi ike na ọ bụghị mmadụ nile ga-emetụ ya aka n’ebe ha na-ekwesịghị imetụ ya aka, ma ọ bụ gwa ya ka o nupụrụ Chineke isi, ma ọ bụkwanụ gwa ya ka ọ ghara ịkọrọ mama ya ma ọ bụ papa ya ihe merenụ. Dị nnọọ ka a na-ebu ụzọ akwadebe ebe e si agbapụ ma ọkụ gbawa n’ụlọ, ihe mere e ji enye ntụziaka a bụ maka a dịghị ama ama. O nwere ike ọ dịghị ihe ga-emenụ.

      Kụziere Nwa Gị Ihe Ndị Bụ́ Isi Ọ Ga-eme Iji Chebe Onwe Ya

      Ihe nke atọ anyị ga-atụle bụ ịkụziri nwa gị ihe ndị dị mfe o nwere ike ime ma mmadụ chọọ imetọ ya mgbe ị na-anọghị. Otu ụzọ a na-atụkarị aro isi mee ya bụ ime ya dị ka ebe a na-eme egwuregwu. Nne na nna nwere ike ịjụ nwa ha, sị, “Ọ bụrụ na ihe dị otú a ma ọ bụ ihe dị otú a emee, gịnị ka ị ga-eme?” nwa ha azaa. I nwere ike ịjụ ya, sị, “Ọ bụrụ na mụ na gị esoro gaa ahịa, otu ihe emee, gị achọwazie m achọwa? Olee otú ị ga-esi chọta m?” O nwere ike ihe nwa ahụ ga-aza gị abụghị ihe ị tụrụ anya ka ọ zaa. Ma, iji nyere ya aka, i nwere ike ịjụkwu ya ajụjụ ụfọdụ, dị ka, “Ò nwere otú ọzọ ka mma i nwere ike isi chọta m?”

      I nwekwara ike isi otú ahụ jụọ nwa gị ihe kasị mma ọ ga-eme ma mmadụ chọọ imetụ ya aka n’ụzọ na-adịghị mma. Ọ bụrụ na ajụjụ ndị ahụ na-enye nwa ahụ nsogbu n’obi, i nwere ike ịkọrọ ya akụkọ banyere nwatakịrị ọzọ. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịkọrọ ya, sị: “Otu nwatakịrị nwanyị na onye ikwu ya ọ hụrụ n’anya nọ. Ma, onye ikwu ya ahụ achọọ imetụ ya aka n’ebe ọ na-ekwesịghị imetụ ya aka. Gịnị ka i chere nwatakịrị ahụ kwesịrị ime ka onye ahụ ghara imetọ ya?”

      Gịnị ka i kwesịrị ịkụziri nwa gị ka o mee ma ọ bụrụ na a chọọ imetụ ya aka n’ebe na-ekwesịghị ekwesị? Otu onye na-ede akwụkwọ dere, sị: “Iji olu ike sị ‘Mba!’ ma ọ bụ ‘Anwakwala ya anwa!’ ma ọ bụ ‘Hapụ m aka!’ ezuola ime ka onye ahụ kwụsị ihe ahụ ọ chọrọ ime, ma ọ bụkwanụ mee ka ọ hapụ nwa ahụ ma chọwa onye ọzọ.” Nyere nwa gị aka ka o gosi unu otú ọ ga-esi mee ya. Nke a ga-eme ka obi sie ya ike iji olu dara ụda jụ ime ihe ọjọọ a gwara ya mee, si n’ebe ahụ pụọ ngwa ngwa, ma kọọrọ gị ihe nile merenụ. Nwa ọ bụla nke ghọtara ọzụzụ a nke ọma nwere ike ichefu ya n’ime izu ole na ole ma ọ bụ ọnwa ole na ole. Ya mere, na-enye ya ọzụzụ a mgbe nile.

      Ndị nile so na-elekọta nwa ahụ, tinyere ụmụ nwoke—ma ọ̀ bụ papa ya, nna ya nke kuchiri ya, ma ọ bụ ndị ikwu ya bụ́ ndị nwoke—kwesịrị iso na-akụziri nwa ahụ ihe ndị a. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ndị nile so akụziri nwa ahụ ihe ndị a na-ekwe ya nkwa na ha agaghị emetọ ya. Ọ dị mwute na ebe a kasị emetọ ụmụaka bụ n’ime ezinụlọ ha. Isiokwu na-esonụ ga-ekwu otú i nwere ike isi mee ka ezinụlọ unu ghọọrọ ụmụ gị ebe ga-echebe ha ka ndị na-emetọ ụmụaka ghara imetọ ha.

      [Ihe odide ala ala peeji]

      a Ndị ọkachamara kwuru na ọtụtụ ụmụaka e metọrọ na-eji omume egosi na o nwere ihe merenụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwatakịrị emee ihe o toferela ime, bụ́ nke a na-atụghị anya na ọ ka ga-eme, dị ka ịba mamịrị n’ute, ịdị na-agbakụkarị ndị mụrụ ya n’ahụ́, ma ọ bụ na-atụ ụjọ ịnọ nanị ya, ọ na-egosi na ọ pụrụ ịbụ na o nwere ihe na-enye ya nnọọ nsogbu n’obi. E kwesịghị ikwubi na omume ndị ahụ na-egosi na e metọọla ya. Jiri nwayọọ chọpụta ihe kpatara nwa gị ji eme omume ndị ahụ ka i wee nwee ike kasie ya obi, mesie ya obi ike, chebekwa ya.

      b Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

      [Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo nke dị na peeji nke 5]

      Bụrụ onye mbụ ga-echebe nwa gị ka a ghara imetọ ya

      [Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo nke dị na peeji nke 7]

      Kọọrọ nwa gị ihe ndị o kwesịrị ịma banyere mmekọahụ

      [Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo nke dị na peeji nke 8]

      Kụziere nwa gị ihe ndị bụ́ isi ọ ga-eme iji chebe onwe ya

      [Igbe dị na peeji nke 4]

      IMETỌ ỤMỤAKA—NSOGBU ZURU ỤWA ỌNỤ

      N’afọ 2006, odeakwụkwọ ukwu nke Òtù Mba Ụwa gụpụtara otu akụkọ ụwa ná Nzukọ Ezumezu nke Òtù Mba Ụwa nwere. Akụkọ ụwa ahụ kwuru banyere ihe ike a na-emeso ụmụaka. Onye chịkọtara akụkọ a bụ onye nta akụkọ nọọrọ onwe ya nke na-achụrụ Òtù Mba Ụwa nta akụkọ. Dị ka akụkọ ahụ si kwuo, n’otu afọ na-adịbeghị anya gara aga, ‘e dinara ihe dị ka otu narị nde ụmụntakịrị nwanyị na nde iri ise n’ike, dinaakwa ihe dị ka nde ụmụntakịrị nwoke iri asaa na atọ n’ike, bụ́ ndị na-erubeghị afọ iri na asatọ, ma ọ bụkwanụ metọọ ha n’ụzọ ndị ọzọ.’ Ọnụ ọgụgụ a buru oké ibu. Ma, akụkọ ahụ kwukwara, sị: “Ọnụ ọgụgụ a erughị mmadụ ole e mere ụdị ihe a.” Otu nnyocha e mere ná mba iri abụọ na otu na-egosi na n’ebe ụfọdụ, e metọrọ ihe dị ka ụmụ nwanyị anọ n’ime ụmụ nwanyị iri ọ bụla, metọọkwa ihe dị ka ụmụ nwoke atọ n’ime ụmụ nwoke iri ọ bụla mgbe ha dị obere. Ọtụtụ n’ime ndị rụsara ha arụrụala a bụ ndị ikwu ha!

      [Igbe dị na peeji nke 6]

      OTÚ E SI ARATA ỤMỤAKA

      Ọ ga-esi ike onye na-emetọ ụmụaka amanye onye ọ chọrọ imetọ amanye. Kama nke ahụ, ọ ga-achọ iji nwayọọ nwayọọ rata ụmụaka. Otú o si amalite bụ ịhọrọ onye ọ ga-emetọ. Ọ na-abụkarị nwatakịrị o yiri ka ọ̀ ga-aghọgbute ngwa ngwa, nke na-ekwere ihe ọ bụla a gwara ya. Ihe ọzọ ọ ga-eme bụ ịmalite mesowe nwa ahụ omume ọma. O nwekwara ike ịnwa ime ka ndị mụrụ nwa ahụ tụkwasị ya obi. Ndị na-emetọ ụmụaka na-emekarị ka à ga-asị na ha nwere ezigbo mmasị n’ebe nwa ahụ na ndị ezinụlọ ya nọ.

      Ka oge na-aga, onye ahụ na-emetọ ụmụaka ga-amalite ịkwadebe nwa ahụ ka o wee metọọ ya. Ọ ga-eji nke nta nke nta metụwa nwa ahụ aka n’ahụ́, na-ele ya anya n’ihu iji gosi ya na ya hụrụ ya n’anya, mee ka ya na nwa ahụ gbawa mgba egwuregwu, na-apịkwa ya aka n’ebe ndị ga-eme ka ọchị tọwa ya. O nwere ike ịdị na-enye nwa ahụ onyinye mgbe nile ma na-akpọ ya aga n’ebe ụmụaka ibe ya, ụmụnne ya, na ndị mụrụ ya na-anọghị, ka nanị ya na nwa ahụ nọrọ. Mgbe oge na-aga, o nwere ike ịgwa nwa ahụ ka ọ ghara ikwe ka ndị mụrụ ya mara banyere ihe ụfọdụ—ikekwe banyere onyinye o nyere ya ma ọ bụ atụmatụ ha na-eme ime mkpapụ nanị ha. Ihe ndị a bụ ihe ga-eme ka ọ dịrị ya mfe ịghọgbu nwa ahụ. Mgbe onye ahụ na-emetọ ụmụaka merela ka ma nwa ahụ ma ndị mụrụ ya tụkwasị ya obi, mara na ọ dịla njikere imetọ nwa ahụ.

      Ọ ga-achọkwa iji nnọọ akọ nweta nwa ahụ kama imetọ ya n’ike ma ọ bụ ịmanye ya amanye. Ihe o nwere ike iji nweta nwa ahụ bụ ọchịchọ nwatakịrị ahụ nwere ịmata banyere mmekọahụ. O nwere ike ịgwa ya na ya ‘ga-akụziri’ ya banyere mmekọahụ, ma ọ bụkwanụ na ha ga-egwuri otu ‘egwuregwu pụrụ iche’ nke ọ bụ nanị ha abụọ kwesịrị ịma banyere ya. O nwere ike gbalịa igosi nwa ahụ foto ma ọ bụ fim ndị gba ọtọ iji mee ka omume ọjọọ a yie ihe kwesịrị ekwesị.

      Ọ bụrụ na o mechaa metọọ nwa ahụ, ọ ga-achọzi ịhụ na o nweghị onye nwa ahụ ga-akọrọ ihe merenụ. O nwere ike iji ụzọ aghụghọ dị iche iche mee ka nwa ahụ ghara ịkọrọ onye ọ bụla ihe merenụ. O nwere ike iyi nwa ahụ egwu, ma ọ bụ gwa ya na ya ga-akọrọ ndị mmadụ àgwà ọjọọ ndị o nwere, ma ọ bụ gwa ya na ọ bụ ya mere o ji metọọ ya, ma ọ bụ, ikekwe jiri ụzọ aghụghọ a nile mee ka ọ ghara ịkọrọ ya onye ọ bụla. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịgwa ya, sị: “Ọ bụ gị kpatara ya. Ị gwaghị m ka m kwụsị ya.” O nwekwara ike ikwu, sị: “Ị gwa papa gị na mama gị, ha ga-akpọrọ m ndị uwe ojii ma tụọ m nga mkpụrụ ọka.” Ma ọ bụkwanụ, ya asị: “Ọ bụ nanị mụ na gị kwesịrị ịma banyere ya. Ị gwa ya ndị mmadụ, o nweghị onye ga-ekweta ihe i kwuru. Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị mata, m ga-emerụ ha ahụ́.” O nweghị ụzọ aghụghọ onye ahụ na-agaghị agbalị isi ghọgbuo nwa ahụ.

      [Foto dị na peeji nke 5]

      Ka uche gị dịrị n’ihe nile nwa gị na-eme

      [Foto dị na peeji nke 7]

      Ahapụla ịkụziri nwa gị banyere mmekọahụ

      [Foto dị na peeji nke 8]

      Kụziere nwa gị ka o jiri olu ike sị “mba” ma kwụdosie ike n’ihe o kwuru ma mmadụ chọọ imetọ ya

  • Mee Ka Ezinụlọ Unu Bụrụ Ebe Nchebe
    Teta!—2007 | Ọktoba
    • Mee Ka Ezinụlọ Unu Bụrụ Ebe Nchebe

      “NDỊ na-enweghị obi mmadụ.” Ọ bụ otú ahụ ka Bible si kọwaa ọtụtụ ndị bi n’oge anyị a nke a na-akpọ ‘ụbọchị ikpeazụ.’ (2 Timoti 3:1, 3, 4) Otú imetọ ụmụaka si ju ebe nile n’ezinụlọ bụ ihe àmà doro anya na amụma ahụ bụ eziokwu. N’eziokwu, okwu Grik bụ́ aʹstor·gos, nke a sụgharịrị ‘enweghị obi mmadụ’ n’Igbo, na-egosi na ụdị ịhụnanya nke kwesịrị ịdị n’ezinụlọ ga-akọ ụkọ, karịsịa, n’etiti ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha.a Ọ na-abụkarịkwa mgbe a na-enweghị ụdị ịhụnanya a ka a na-emetọ nwatakịrị.

      Ụfọdụ ndị na-eme nnyocha sịrị na ndị kasị arụ ụdị arụrụala a bụ ndị nna. Ndị ọzọ so arụ ya bụ ndị ikwu bụ́ ndị nwoke. Ọ bụ eziokwu na ọ bụ ụmụntakịrị nwanyị ka a na-emetọkarị, a na-emetọkwa ụmụntakịrị nwoke. Ụmụ nwanyị sokwa arụ arụrụala a karịa ka i nwere ike iche. Ikekwe, ụdị arụrụala a na-adịghị ekwulitekarị bụ nwanne idina nwanne ya. Otú ha si eme ya bụ na onye nke tọrọ ibe ya ma ọ bụ nke ka ibe ya ike ga-amanye onye nke ọ tọrọ ma ọ bụ onye ọ ka ike ka ya na ya nwee mmekọahụ. Ma ọ bụkwanụ rata nwanne ya nwoke ma ọ bụ nwanne ya nwanyị nke ọ tọrọ ma ọ bụ nke ọ ka ike ka ya na ya nwee mmekọahụ. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ụdị omume ndị a ga na-agba gị agba ná ntị ịnụ.

      Gịnị ka ị ga-eme ka a ghara inwe nsogbu ndị a n’ezinụlọ unu? O doro anya na ọ dị onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ọ bụla mkpa ịmụta ụkpụrụ ụfọdụ ndị katọrọ ime omume rụrụ arụ na iji ụkpụrụ ndị ahụ kpọrọ ihe. Ebe kasị mma isi nweta ụdị nduzi ahụ bụ n’Okwu Chineke, bụ́ Bible.

      Ihe Okwu Chineke Kwuru Banyere Mmekọahụ

      Ka ezinụlọ wee bụrụ ebe nchebe, onye ọ bụla nọ na ya kwesịrị ịdị na-eme omume otú Bible kwuru ka a na-eme ya. Bible adịghị ezo ọnụ n’okwu metụtara mmekọahụ. Ọ na-ekwu ya hoo haa, nakwa n’ụzọ dị ùgwù. O kwuru na Chineke mere ka mmekọahụ bụrụ ihe na-enye di na nwunye obi ụtọ. (Ilu 5:15-20) Ma, ọ kagburu mmadụ na onye ọ bụla na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya inwe mmekọahụ. Dị ka ihe atụ, Bible kwuru hoo haa na mmadụ na onye ikwu ya inwe mmekọahụ jọgburu onwe ya. Na Levitikọs isi nke iri na asatọ, a kagburu ụdị dị iche iche nke mmadụ na onye ikwu ya inwe mmekọahụ. Lee ihe e kwuru ebe a: ‘Nwoke ọ bụla abịarula nso onye ahụ́ ya ọ bụla, ikpughe ọtọ ya [ka ya na ya nwee mmekọahụ]: Mụ onwe m bụ Jehova.’—Levitikọs 18:6.

      Jehova gụnyere mmadụ idina onye ikwu ya n’ime “ihe arụ” ndị ọ ga-abụ onye mee ya, e gbuo ya. (Levitikọs 18:26, 29) N’ezie, Onye Okike adịghị ewere okwu a dị ka obere okwu. Taa, ọtụtụ ndị ọchịchị adịghịkwa ele ya anya dị ka obere okwu. Ha etiela iwu ndị kagburu mmadụ idina onye ikwu ya. Iwu ndị ahụ na-ekwukarị na ọ bụrụ na onye toro eto edinaa nwatakịrị, ihe onye ahụ toro eto mere bụ idina mmadụ n’ike. Olee ihe mere o ji bụrụ otú ahụ ebe ọ bụ na onye ahụ amanyeghị nwa ahụ amanye?

      Ọtụtụ ndị ọchịchị aghọtala ihe Bible nọ na-ekwu kemgbe banyere ụmụaka, ya bụ, na ha anaghị eche echiche otú ndị toro eto si eche. Dị ka ihe atụ, Ilu 22:15 kwuru, sị: “Uche gbagọrọ agbagọ bụ ihe e kekọtaworo n’obi nwata.” Pọl onyeozi dekwara n’ike mmụọ nsọ, sị: “Mgbe m bụ nwa ọhụrụ, m . . . na-eche echiche dị ka nwa ọhụrụ, na-ele ihe anya dị ka nwa ọhụrụ; ma ugbu a m ghọworo dimkpa, ewepụwo m omume nwa ọhụrụ.”—1 Ndị Kọrint 13:11.

      Nwatakịrị enweghị ike ịghọtacha ihe inwe mmekọahụ pụtara, o nweghịkwa ike iji echiche ya mata ihe ga-emecha si n’inwe mmekọahụ pụta n’ọtụtụ afọ na-abịa abịa. N’ihi ya, n’ọtụtụ ebe, e weere ya na ụmụaka amaghị ihe ha na-eme mgbe ha kwetara ka ha na mmadụ nwee mmekọahụ. Otú ọzọ e nwere ike isi kwuo ya bụ na ọ bụrụ na onye toro eto (ma ọ bụ onye ntorobịa tolitetụrụlanụ) edinaa nwatakịrị, ọ gaghị azọrọli isi ya ma o kwuo na nwa ahụ ajụghị mgbe ọ na-edina ya, ma ọ bụ na ọ bụ nwa ahụ sịrị ya dinaa ya. Ikpe idina mmadụ n’ike mara onye ahụ. Ihe o mere bụ mpụ, ntaramahụhụ ya na-abụkarịkwa ịtụ onye ahụ mkpọrọ. Ọ bụ onye ahụ nke dinara mmadụ n’ike ka ikpe mara, ọ bụghị onye ahụ e dinara n’ike.

      Ma, ọ dị mwute na ndị ọchịchị adịghị ata ọtụtụ ndị mere ụdị mpụ ahụ ahụhụ n’oge anyị a. Dị ka ihe atụ, n’Australia, a chọpụtala na ọ bụ nanị otu onye n’ime mmadụ iri ọ bụla nke mere ụdị mpụ ahụ ka a na-akpụpụ n’ụlọ ikpe, ọ bụkwa ole na ole n’ime ha ka a na-ama ikpe. Otú ahụ ka ọ dịkwa ná mba ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na ndị ọchịchị nwere ike ime ihe ụfọdụ iji chebe ezinụlọ Ndị Kraịst, itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ nwere ike ichebe ha karịsịa.

      Ezi Ndị Kraịst ghọtara na Chineke ahụ nke mere ka e dee ụkpụrụ ndị ahụ n’Okwu ya agbanwebeghị. Ọ na-ahụ ihe ọ bụla anyị na-eme, ọbụna ndị nke ọtụtụ mmadụ na-agaghị ahụli. Bible kwuru, sị: ‘Ọ dịghị ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’anya ya, ma ihe nile gba ọtọ ma bụrụ ndị e kpughepụrụ ekpughepụ n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.’—Ndị Hibru 4:13.

      Anyị ga-aza Chineke ajụjụ ma ọ bụrụ na anyị emebie iwu ya ma mee ihe ga-ewute ndị ọzọ. N’aka nke ọzọ, ọ na-agọzi anyị maka idebe iwu ndị bara uru o nyere banyere ezinụlọ. Olee ụfọdụ n’ime iwu ya ndị a?

      Ezinụlọ nke Ịhụnanya Mere Ka Ha Dịrị n’Otu

      Bible na-agwa anyị na “ịhụnanya” bụ “ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.” (Ndị Kọlọsi 3:14) Dị ka Bible kọwara, mmadụ anaghị enwe ịhụnanya nanị n’ime obi ya. Kama nke ahụ, ịhụnanya na-apụta ìhè n’ihe ndị ọ na-akpali onye ahụ ime, ya bụ, n’àgwà ndị ọ na-akpali onye ahụ ịkpa na omume ndị ọ na-akpali onye ahụ izere. (1 Ndị Kọrint 13:4-8) N’ime ezinụlọ, igosi ịhụnanya pụtara iji nkwanye ùgwù, nsọpụrụ, na obiọma na-emeso onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ihe. Ọ pụtara mmadụ ibi ụdị ndụ na-egosi na ya na-ele onye ọ bụla n’ezinụlọ ya anya otú Chineke si ele ya. Chineke nyere onye nke ọ bụla ọrụ dị ùgwù na nke dị mkpa ọ ga na-arụ.

      Onyeisi ezinụlọ, bụ́ nna, kwesịrị ibute ụzọ n’igosi ndị ọzọ ịhụnanya. Ọ ghọtara na e nyeghị Onye Kraịst bụ́ nna ikike ịchị ezinụlọ ya ọchịchị aka ike, ya bụ, imesi nwunye ya na ụmụ ya ike. Kama nke ahụ, ọ na-amụta otú e si achị isi n’aka Kraịst. (Ndị Efesọs 5:23, 25) N’ihi ya, ọ na-eji obiọma na ịhụnanya na-emeso nwunye ya ihe, jirikwa ndidi na obi ebere na-emeso ụmụ ya ihe. Ọ na-echebe ha nke ọma. Ọ na-emekwa ihe nile o nwere ike ime iji hụ na ihe ọ bụla anapụghị ha udo ha na ùgwù ha. Ọ na-emekwa nke a ka ihe ọ bụla ghara ime ka obi koro ha n’elu.

      N’otu aka ahụ, onye bụ́ nwunye, bụrụkwa nne, nwere ọrụ dị oké mkpa, nke dịkwa ùgwù. Bible ji ihe atụ nke otú nnekwu ọkụkụ si echebe ụmụ ya tụnyere otú Jehova na Jizọs si echebe ndị ha. (Matiu 23:37) N’otu aka ahụ, nne kwesịrị iji ichebe ụmụ ya kpọrọ ihe. Ịhụnanya na-akpali ya ime ihe nile o nwere ike ime iji hụ na e nweghị ihe ga-eme ha, hụkwa na obi dị ha ụtọ tupu ya ahụwa maka mkpa nke onwe ya. Nne ma ọ bụ nna ekwesịghị imesi di ma ọ bụ nwunye ya ike, na-eti ya ihe, na-amaja ya, ma ọ bụkwanụ na-emegbu ya. Ha ekwesịghịkwa ịdị na-emeso ụmụ ha otú ahụ; ha agaghịkwa ekwe ka ụmụ ha si otú ahụ na-emeso ụmụnne ha.

      Ọ bụrụ na onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ana-asọpụrụ ibe ya ma na-akwanyere ibe ya ùgwù, ha ga na-enwe ezigbo nkwurịta okwu. Lee ihe onye na-ede akwụkwọ bụ́ William Prendergast kwuru: “Ndị nne na nna nile na ụmụ ha ndị obere na ndị nke nọ n’oge uto kwesịrị ịdị na-ekwurịta okwu nke ọma kwa ụbọchị nakwa n’oge nile.” O kwukwara, sị: “Ọ dị ka nke a ọ̀ bụ ụzọ kasị mma a ga-esi gwọta nsogbu imetọ mmadụ.” N’eziokwu, ọ bụ nnọọ ụdị nkwurịta okwu a e ji ịhụnanya enwe mgbe nile ka Bible gbara ume ka a na-enwe. (Deuterọnọmi 6:6, 7) Ọ bụrụ na e tinye ntụziaka ahụ n’ọrụ, onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ unu ga-enwere onwe ya ikwu ihe dị ya n’obi n’atụghị ụjọ.

      N’eziokwu, anyị bi n’ụwa ajọ omume, ọ bụghịkwa ụdị mmetọ nile ka e nwere ike izetecha. N’agbanyeghị nke a, ezinụlọ nke bụ́ ebe nchebe nwere ike ime ka ihe ka nnọọ mma. Ọ bụrụ na e mejọọ mmadụ n’èzí, ọ maara na ọ ga-aga n’ezinụlọ ya iji nweta nkasi obi na agbamume. Ezinụlọ dị otú ahụ bụ ebe nchebe n’ezie n’ụwa a nke nsogbu jupụtara. Ka Chineke gọzie mgbalị ị na-eme iji mee ka ezinụlọ unu bụrụ ụdị ebe ahụ!

      [Ihe odide ala ala peeji]

      a A na-akọwa okwu Grik ochie a dị ka: “Mmadụ inwere ndị ikwu ya obi ọjọọ.” Otu nsụgharị Bible si otú a kwuo ya: ‘Ndị na-adịghị ahụ ndị ezinụlọ ha n’anya.’

      [Igbe/Foto dị na peeji nke 10]

      ARO NDỊ GA-ENYE AKA MEE KA ỤLỌ UNU BỤRỤ EBE NCHEBE

      Intanet: Ọ bụrụ na ụmụ gị na-aga n’Intanet, e kwesịrị ịkụziri ha ebe ndị ha ga-aga na ebe ndị ha na-agaghị aga ka ha ghara ịdaba ná nsogbu. E nwere ọtụtụ ebe a na-edebe foto ndị gba ọtọ na ebe a na-akparịta ụka n’Intanet, nakwa ebe ndị yiri nke ahụ. Ndị na-emetọ ụmụaka na-eje ebe ndị ahụ achọgharị ụmụaka ma na-arata ha. Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ma ndị mụrụ ụmụ debe kọmputa ha n’ebe na-ezoghị ezo, bụ́ ebe ọ ga-adịrị ha mfe ịchọpụta ihe ụmụ ha ji ya eme. Ndị nne na nna kwesịrị ịhụ na ụmụ ha agaghị agwa onye ọ bụla banyere onwe ha, ma ọ bụ mee ndokwa ka ha gaa hụ onye ha na ya kparịtara n’Intanet, ọ gwụkwala ma nne na nna ha hà kwadoro ka ha mee otú ahụ.—Abụ Ọma 26:4.

      Mmanya Na-aba n’Anya: Ihe mere ọtụtụ ndị ji metọọ ụmụaka bụ n’ihi na ha ṅụrụ mmanya. Ahụmahụ na-egosi na ndị toro eto, bụ́ ndị na-aṅụ oké mmanya anachaghị ejideli onwe ha; ụfọdụ n’ime ha na-eme ihe ndị ha na-agaraghị achọ ime ma a sị na mmanya anaghị egbu ha. Otú o sina dị, nke a na-eme ka e nwekwuo ihe mere e kwesịrị iji na-erube isi na ndụmọdụ Bible nyere ka mmadụ ghara ịbụ onye aṅụrụma na onye na-aṅụbiga mmanya oké.—Ilu 20:1; 23:20, 31-33; 1 Pita 4:3.

      Inyetụ Mmadụ Ohere: Otu nwanyị kwuru, sị: “Mgbe mama anyị nwụrụ, ọ bụ nanị papa anyị bụ onye nọ n’ụlọ anyị nke ji ákwà gechie windo ime ụlọ ya na ọnụ ụzọ ime ụlọ ya. Ọ naghị enyetụ anyị ohere—ọbụna mgbe anyị na-asa ahụ́.” Nwoke ahụ metọrọ ụmụ ya ndị nwanyị nile. Onye ọ bụla n’ezinụlọ kwesịrị ịghọta na ọ dị mkpa inyetụ ibe ya ohere mgbe ụfọdụ. Dị ka ọ dị nne na nna mkpa ịnọ nanị ha mgbe ụfọdụ n’enweghị nwa ha ha na ya nọ, ha kwesịkwara ịhapụ ụmụ ha mgbe ụfọdụ ka ha nọrọ nanị ha ka ha na-eto. Ndị nne na nna ndị maara ihe na-emeso ndị ọzọ ihe otú ha chọrọ ka a na-emeso ha.—Matiu 7:12.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya